Tanko Mohammed: E duola ọkaịkpe kachasị ọhụrụ n'iyi ọrụ

Mohammed Tanko na Muhammadu Buhari Image copyright @BashirAhmad/Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola Tanko Mohammed n'iyi ọrụ dịka okaikpe kachasị na Naịjirịa taa n'Abuja.

Tanko Mohammed ga-anọchi anya Walter Onnoghen bụbu onye nọ n'ọkwa ahụ.

Cheta na akwụsịtụrụ Onnoghen ọrụ ya maka ebubo mkpachi akụnaụba ya.

Gịnị na-afịọ n'Enugwu?

Ndị mmadụ bi n'Enugwu na-ata ikikirieze tata bụ Wenezde dịka otu jikọrọ ndị na-ere ma na-ekesa mmanụ ụgbọala gbachiri ọdọ ahịa dị iche iche n'ihi nsogbu dị n'etiti ha.

N'Egwuregwu,

Aka na-achịkọta otu Manchester United bụ Ole Gunner Solskajaer arịọla arịrọ ka ndị nso Club ahụ akpọrọ Red Devils na Bekee nabata Paul Pogba ma mee ka obi ruo ya ala n'otu ha dịka ọ na-akwado ibido afọ ọhụrụ na Premier Lig.

US Visa: Inweta akwụkwọ njem ga-esiri ndị kpara agwa megide ntuliaka 2019 ike

Image copyright @USembassy Twitter

Ndị pati ndọrọndọrọ ọchịchị APC na PDP azachiela embasi Amerika okwu ha kwuru maka ịkpachapụ ndị mere nrụrụaka ndọrọndọro ọchịchị akwụkwọ ikike ị ba ala ha.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi PDP bụ Kola Ologbondiyan kwuru na egwu anaghị atụ ha bụ PDP maka okwu a, makana aka ha dị ọcha, na ọbụghị ha nọ n'isi ọchịchị Naịjirịa.

O sị na ọ bụ ndị pati nọ n'isiọchịchị kwesiri ịtụ egwu.

N'aka ọzọ, onye nke APC bụ Lanre Issa Onilu zara na ya agụbeghị ya bụ akwụkwọ embasi US biputere.

Ọ sị na "ọ bụ ahụ okwu, ahụ ọsịsa ya".

Lanre kwukwara na ebe ọ bụ na ya bụ ụlọọrụ nnọchite anya mba Amerika na Naịjirịa emetubeghị onye ha na-agwa aka, ọ baghị uru ịzahachi ha.

Ọ sị na "ugbua ka bụ ụtụtụ".

Cheta na-ịnweta akwụkwọ njem ịga Amerịka ga na-esiziri ndị kpara agwa megide ntuliaka 2019 ike dịka mba ahụ wepụtara ha anya ọbaraọbara.

Ọnụ na-ekwuru Odeakwụkwọ Amerịka bụ Morgan Ortagus bụ onye kwupụtara nke a n' igwe okwu Twitter ya.

Ortagus kwuru na nke a bụ ụzọ mba ahụ si egosi na ha kwụsịrị ike na inyere Onyeisiala Muhammadu Buhari aka ikwalite ọchịchị onyekwuoucheya.

Mana ha edepụtaghị aha ndị mmachiị ọhụrụ a metụtara.

Ụgbọelu Air Peace efefeela ebe o kwesịrị ifetu na Legọs

Image copyright Instagram/flyairpeace

Ihe mmapụ obi mere n'ụbọchị Tuzde, Julaị 23, 2019, dịka otu ụgbọelu ndị Air Peace si Pọtakọt fefere ebe ọ kwesịrị ịkwụsị ka ọ na-efetu n'ọdọụgbọelu nke Legọs.

Henrieta Yakubu nke ngalaba na-ahụ maka ụgbọelu bụ 'Federal Airport Authority of Nigeria' (FAAN), gwara BBC na ha na-eme nyocha ịmata ihe butere ya.

Dịka Yakubu gwara BBC Pidgin, ọ sị na ngalaba Accident Investigation Bureau (AIB) na-enyocha ihe mere.

O kwuru sị, "Biko ọ bụ obere mmafe ka ụgbọelu ahụ mafere, ọ kpọkasịghị. Ndị njem nọ n'ime ya emerụghị ahụ.

"Ka ọ dị ugbua, AIB nọ ebe ihe a mere na-enyocha ya. Achọghị m ikwu ihe ọbụla ruo mgbe ha mechara. Mana ụgbọelu ahụ akpọkasịghị."

Cheta na ụgbọelu Air Peace ọzọ nwetara onwe ya n'ime ọhịa n'ime ọnwa Juun 2019.

Nke a na-abịa ka otu afọ ihe ụdịrị ihe a mechara, gafere. Gụọ maka ya ebe a Ọ fọrọ nwa ntịị ka ọdachi mee n'ụgbọelu Air Peace?

Gịnị ka ị ma maka #MinisterialList ọhụrụ Buhari wepụtara?

Image copyright Sharon Ikeakor na Uche Ogah

N'ime aha mmadụ iri anọ na atọ Buhari wepụtara, naanị mmadụ asaa bụ ụmụnwaanyị, ebe o nweghị onye pekarịrị afọ iri anọ na ise n'ime ha.

Ụfọdụ ndị mmadụ akatọọla aha ndị mịnịsta ọhụrụ e wepụtara sị na ọ bụghị ihe a tụrụ anya ka a hụrụ dịka ụmụnwaanyị na ndị na-eto eto anọghị na ya dịka o kwesịrị.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ministerial list: Ụmụ Naijiria akatọọla ndị mịnịsta ọhụrụ

Boris Johnson bụ Praịm Mịnịsta ọhụrụ Briten

Image copyright @BorisJohnsonTwitter

A họpụtala Boris Johnson dịka Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Briten.

Johnson, onye ji ihe ruru vootu puku iri anọ na isii merie Jeremy Hunt, ga-anọchi Theresa May rituru n'ọnwa gara aga.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Boris Johnson abụrụla Praịm Mịnịsta Briten

N'egwuregwu,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Egwuregwu a wetara "pre season" bụ egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke Chelsea n'isi njedebe

Chelsea gwọrọ Barcelona ara ka ha ji goolu abụọ a sara otu n'ọgwụgwụ oge ji merie ha ma bulie Iko Rakuten.

Chelsea ji nke a weta egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke a kpọrọ "pre-season" n'isi njedebe.

Gụọ etu o si mee ka o ju gị afọ ebe a: Chelsea akọọla Barcelona ka ncha nkọta

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe mere e ji kutuo igwe Rochas ji chọọ Owere mma

Ihe BBC hụrụ n'Owerre bụ na akutuola igwe ndị Okorocha jiri chọ Imo steeti mma mgbe ọ nọ n'ọchịchị.

Steve Osuji gwara BBC Igbo na ọ bụ iji chekwa ndị mmadụ ka eji nye iwu ịkwatu ya bụ igwe.

N'ọnụ ya "Igwe ndị ahụ esighizi ike, o nwere nke dara n'ime ya dagide ụgbọala"

O kwuru na ọ bụ ka ọ ghara ịmerụ ndị mmadụ ahụ ka eji ewetu ya.

N'otu aka ahụ, Emeka Ihedioha na onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari enweela nzụkọ imeụlọ gbasara Imo steeti.

Dịka Ihedioha siri kwuo, okwu ndị ewelitere gụnyere ịkwalite ọrụ ugbo, agụmakwụkwọ, ahụike nakwa iwulite ngalaba dị icheiche na steeti ahụ.

"Ndụ mmadụ nkịtị adịghị ndị ọchịchị mkpa"

Ụmụ Naịjirịa na-egosi iwe ha na soshal midia maka ọnwụ Precious Owolabi bụ onye ntaakụkọ Channels.

Owolabi nwụrụ dịka ọ na-arụ ọrụ isete ebe ndị uweojii na ndị shiites na-akwata ya na Abuja.

N'akụkọ ofesi,

Image copyright Getty Images

Mba Sawụt Koria ekwetala na ọ bụ ha gbara ụgbọ agha nke mba Rọshịa mgbọ mgbe ọ batara na mbara igwe mba ha.

Ha kwuru na ọ bụ maka na ọ dara iwu mbaraigwe mba Sawụt Koria.

N'egwuregwu,

Ọ bụ egwu ọṅụ na-akpọtụ ugbua n'Akwa Ibom dịka otu Akwa starlets ritere mbuli elu ruo na NPF league dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu merie otu Shooting stars.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEhi ga-eberịrị 'moo' tupu e ree ya n'ahịa anyị