Ministers List : Ihe ndị ị maghị maka ihu ọhụrụ so na ndị mịnịsta

Ahia a na-eche azụọla kama ọ bụghị mmadu niile biara ahia.

Aha ndị mịnịsta ga-eso rụọ ọrụ n'ọchịchị Muhammadu Buhari agba nke abụọ apụtala.

Dịka Buhari kwere nkwa na ya ga-eji aka ya nyoputa ndị tozuru irụ ọrụ, mana n'ime aha ndị a, e nwere naanị ihu ihu ọhụrụ iri na atọ.

Ọ bụ iwu na steeti niile ga-enweta Minista?

Ezigala Mịnịsta nchekwa obodo Zamfara

Lee ndepụta ndị bụ ihu ọhụrụ nakwa ihe ndị ị maghị maka ha:

Sharon Ikeazor :

Image copyright Sharon Ikeazor
Nkenke aha onyonyo Sharon Ikeazor bụ okaiwu si Anambra steeti ma rụọ ọrụ dịka dịka onyeisi 'Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)'

Ada Anambra steeti a bụ okaiwurụburu dịka onyeisi 'Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)'

Lee ihe ndị mmadu kwuru maka nhọpụta a họpụtara ya.

Henry Okelue kwuru na nhọpụta di mma na ekwu kwa na ezigbo ọrụ Sharon Ikeazor rụrụ na PTDA bụ ezigbo ọmụmaatụ.

Femi Fani-Kayode zigara ya ozi ekele na Twitter.

Wale Adetona gosipụtara obi ụtọ ya ma kwuo na ọ ma ọrụ ya.

Uchechukwu Sampson Ogah

Image copyright Uchechukwu Sampson Ogah
Nkenke aha onyonyo Uchechukwu Sampson Ogah bụ nwaafọ Abia steeti ma bụrụ kwa onyeisi ulọ ọrụ nmanụ agbidi bụ 'Master Energy Group' nke nwere ngalaba azumahia ruru iri na ise.

Uchechukwu Sampson Ogah bụ nwaafọ Abia steeti ma bụrụ kwa onyeisi ulọ ọrụ nmanụ agbidi bụ 'Master Energy Group' nke nwere ngalaba azumahia ruru iri na ise.

Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya.

Chukwuemeka Nwajiuba

Image copyright Emeka Nwajiuba Fans United
Nkenke aha onyonyo Chukwuemeka Nwajiuba bụ okaiwu ma bụrụ kwa nwaafọ Imo steeti onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi Unitrust Insurance Co. Ltd .O crukwara ugboro abụọ n'ulọ omeiwu nta.

Nwa afọ Imo steeti bụ okaiwu ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi 'Unitrust Insurance Co. Ltd .

Ọ nọchikwara ndị be ha ugboro abụọ n'Ụlọomeiwu Nta.

@Ekensazubuike kwuru na nhọpụta ya bụ ihe ziri ezi.

Timipre Sylva

Image copyright Ogedi Festus
Nkenke aha onyonyo Timipre Sylva chibụrụ dị ka Gọvanọ Bayelsa steeti .

Timipre Sylva chibụrụ dịka gọvanọ Bayelsa steeti bido n'afo 2007 na 2008.

Ogedi Festus kelere ya maka nhọpụta a họpụtara ya.

Johnson Collins Ufuoma kwuru na nghoputa a ghọpụtara Timipre Sylva amasighị ya

Godswill Obot Akpabio

Image copyright Godswill Akpabio
Nkenke aha onyonyo Godswill Akpabio chiburu ka Gọvanọ Akwa Ibom steeti ma bụrụ kwa onye okaiwu ma onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị

Lee ihe ndi mmadu n'ekwu maka nghọpụta aghọpụtara ya -

Emjay Ekanem na-ekele ya

Eleshtalks ruturu aka maka ikpe o chere na ọ nwere

Image copyright Festus Keyamo
Nkenke aha onyonyo Festus Keyamo nwaafọ Delta rụrụ ọrụ ka ọnu na-ekwuchitere otu na-ahu maka ndọrọndọrọ ọchichị Muhammadụ Buhari mgbe ọ na-azọ okwa Onyeisiala.

Festus Keyamo, nwaafọ Delta rụrụ ọrụ ka ọnu na-ekwuchitere otu na-ahu maka ndọrọndọrọ ọchichị Muhammadụ Buhari mgbe ọ na-azọ okwa Onyeisiala.

Lee ihe ndịmmadụ nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya

Adebayo Bankole Akintunde gosiputara na otụghị anya nghopụta ya

Emmanuel E Uduaghan na-ekele ya

Gbemisola Ruqayyah Saraki

Image copyright Gbemisola Ruqayyah Saraki
Nkenke aha onyonyo Gbemisola Ruqayyah Saraki chịrị dị ka onyennọchite ndị 'Kwara Central Senetorial District' n'otu PDP n'afọ 2003, ọ banyere APC n'afọ 2015

Lee ihe ndị mmadu n'ekwu maka nghọpụta ya

Oluwatobi Akangbe T kwuru na Gbemisola Saraki na-eri elele igba nwanne ya mgba okpuru

Najeebwali kwuru na kpakpando ọhụrụ ebiliela

Rauf Aregbesola

Image copyright @aregbeTwitter
Nkenke aha onyonyo Rauf Aregbesola

Lee ndị ụgbọ Minista hapụrụ

1) Solomon Dalung

2) Abdulrahaman Dambazau

3) Udo Udoma

4) Isaac Adewole E

5) Okechukwu Enelamah

6) Emmanuel Ibe Kachikwu

7) Mansar Dan Ali

8) Audu Ogbeh

9) Adebayo Shittu

10) Usani Usani

Lee Akụkọ ga-amasị gị

Ọgụ shịịte eriela isi onye ntaakụkọ Channels

Ọ bụghị anụ ehi gburu udele nwụrụ n'Eke Ihe dị n'Enugu state

Ihe mere e ji kutuo igwe Rochas ji chọọ Owere mma