Ministerial Screening: Ụfọdụ ihe ịrịbaama mere na nhọpụta ndị ọchịchị e mere n'ụlọ nzụkọ ukwu

Senate screeening Image copyright Nigerian Senate/ Facebook

Ihe mbụ gbagwojuru anya bụ na nwaanyị mbụ bịara ya bụ nnyocha bụ Sharon Ikeazor sị Anambra steeti enweghị ajụjụ ajụrụ ya.

Image copyright Sharon Ikeazo/Twitter
Nkenke aha onyonyo Sharon Ikeazo

Kama ha sị ya gbuchapụrụ ndị omeiwu gawa maka ọ bụ nwaanyị n'ihi na ihe nwaanyị na-adị ha mma.

Onye ọzọ kpara ụka ọchị ebe ahụ bụ Dede Rochas Okorocha bụ onye juru Olamilekan Adegbite nke Ogun steeti ihe ọ ga-eme ịweta obi aṅụrị na Naịjirịa ọkachasị ugbua obi aṅụrị kọrọ ụkọ n'ala a.

Image copyright Facebook/Rochas

Cheta na Rochas Okorocha hibere ministrị na ahụ maka obi aṅụrị mgbe ọ bụ gọvanọ Imo steeti.

Ihe gbasara obi aṅụrị na-echu ya ụrọ.

Image copyright Ewhrudjakpo Lawrence/Twitter

Nwaamadị ọzọ jụrụ ajụ atụghị anya ebe ahụ bụ Ewhrudjakpo Lawrence bụ onye juru sị "ụgbụa gọọmenti etiti kwusigoro ịta akpụka anụ bụ kanda, bụ nke na enya ha obi aṅụrị, kedụ ụzọ ọ ga-esi wete obi aṅụrị n'ụlọ ndị mmadụ?"

Ndị mmadụ kwachakwara ọchị na ya bụ ajụjụ.

Nke ọzọ bụ Enyinnaya Abaribe gwara Godswill Akpabio na-enwezụga na ha kwekọrịtara na onye bụbu onye otu ha ga-egbuchapụrụ ha na-azaghị ajụjụ ọbụla, na ya kara ịme ya ka ọ gbaa ọsịsọ.

Ndị Sineti gwakwara Rotimi Amechi ankwa George Akume ha gbuchepụrụ ha gaa ihu na-azaghịa ajụjụ ọbụla.

naAkụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara