Shia Protest: 'Gọọmentị Buhari na ndị Shia na-akpa nkata'

Nsọgbụ ndị Shia Abuja Image copyright KOLA SULAIMON

Dịka a ka na-ekwu maka ịkwa isi dị n'etiti ndị ofufe Shia bụ ndị akpọrọ Islamic Movement of Nigeria (IMN) na ndị nchekwa Naịjirịa, akụkọ na-apụta na ha na gọọmentị Naịjirịa kpara nkata maka etu a ga-eji tinye mma n'ọbọ.

Ndị Shia na-eme ngagharị iwe kwa ụbọchị ka atọghapụ onyeisi ha bụ Ibrahim el-Zakzaky gọọmenti ji kemgbe afọ 2015.

Ọkụekwe otu a bu Ibrahim Musa gwara BBC na ndi otu ha na ndị DSS - bụ ngalaba ọrụ nchekwa Naịjirịa - mere nzukọ ịkpa maka ọgbagahra na-ada n'etiti ha mana okwu ha achịtaghị aja.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya enweghi ike ikwu ihe mere okwu ha jiri gaa etu o si gaa.

Agbanyeghị nke a, BBC enweteghi akaebe nke ha na nzukọ a mere.

Ụfọdụ otu na-agba mbọ maka ikike dịri onye na-ekwu na ekwesịrị ime nchọpụta etu esiri gbuo mmadụ maọbụ mekpaa mmadu ahụ n'ọgbaghara ahụ.

Ha sị na ndị uweojii ji aka ike sowe ndị Shia mana ha na-agọ ụkwụ na aka.

Nkenke aha onyonyo Ụlọ ọrụ ndị ọrụ gbata gbata NEMA a gbara ọkụ n'ọgbaghara ndị Shia

Mmadụ 13 nwụrụ n'ọgbaghara a - Ndị Shia 11, otu onye uweojii nakwa otu onye ntaakụkọ sị Channels TV .

Gọọmentị na-ekwu okwu ịmachị ndị ofufe Shia mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na nke a abụghị ụzọ a ga-eji wụọ mmiri oyi n'ihe mere.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja

Isiokwu Ndị Emetụtara