Leah Sharibu: Anyị na-enwe mkparịtaụka ịzọpụta ya na ndị ọzọ a tọọrọ - Gọọmentị etiti

Leah Sharibu Image copyright TheCable

Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha amalitela mkprịtaụka n'isi ndị a tọọrọ n'ugwu Naịjirịa nakwa Leah Sharibu.

Nke a na-eme dịka aha Leah wuru ewu na soshal midia ụbọchị Tọzde dịka a na-ebo ebubo na ọ nwụọla n'ihe onyonyo Boko Haram ziputere.

Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru n'ime ozi o zipụtere site n'akara Twitter ya, na gọọmenti n- ndị na-echere ozi ka na-kparịta etu a ga esi kpọpụta Leah and ndị ọzọ Boko Haram.

N'otu aka ahụ, Nna mụrụ Leah Sharibu ekwuola na o nwebeghi ihe ọ nụrụ maka nwa ya nwaanyị na nsonso a.

Mgbe BBC kpọtụrụ ya n'ekwentị, ọ kọwara na ịkpeazụ ya na onyeisiala kpakọrịtara bụ afọ gara aga.

"Ọ bụ sọsọ ndị otu okpukpere m na ndị otu alakụba na-akasi m obi gbasara Leah" ka o kwuru.

Cheta na otu ihe onyonyo ahụ pụtara na-egosi mmadụ isii ndị ọrụ enyemaka ka ha na-arịọ gọọmentị ka enyemaka ịgbapụta ha n'aka ndị Boko Haram na mpaghara Ugwu Naịjirịa.

N'ime ihe onyonyo ahụ, otu nwaanyị na-ekwu na a wakporo ha, kpọro ha gawa ebe ha amaghị.

Ndị ọrụ enyemaka a kpọrọ Action Against Hunger sị na mmadụ isii nọ n'ime ihe onyonyo ahụ bụ ndị ọrụ ha.

Otu n'ime ndị ọru enyemaka ahụ kpọro onwe ya, Grace yi uwe ndị ofufe Alakuba, ebe ụmụnwoke ise a na-eche na ha bu ya na-aha na-arụkọ ọrụ gbara ya okiri kiri.

Nwaanyị a kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa na ndị mba ofesi mee ngwa ngwa gbapụta ha.

Na mbido izu a, Action Against Hunger zipurụ akwụkwọ mgbasaozi sị na a wakporo otu ụgbọala ha n'ụzọ Damasak.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro

Ha kwuru na otu n'ime ndị na-akwọrọ ha ụgbọala nwụrụ ebe ndi otu ha ndị ọzọ na-efu efu.

A na-eche na aka Boko Haram na Islamic State of West Africa Province (ISWAP) dị na mwakpo a na-eme n' Ugwu Naịjirịa.

Ndị agha Naịjirịa na-ekwu na ha emekpaala otu ndị a ahụ mana ha ka na-akpa ike dị egwu na mpaghara ahụ.

Akụkọ ga amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?

Isiokwu Ndị Emetụtara