Ndi Igbo na-azụ ahịa na Ghana: Mkpagbu a na-akpagbu anyị akarịala

Ahịa dị n'Akra,Gana Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ahịa dị n'Akra,Gana

Ụmụ Naijiria na-azụ ahịa na mba Gana akpokuola gọọmentị etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ha na-ekwu na mmiri agafeela garị n'okwu mkpagbu ha na-agabiga na mba Gana.

Nke a na-eme dịka otu jikọrọ ndị ahịa Gana a kpọrọ 'Union of Traders Association' (GUTA) ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe ga-akpụ ọkụ n'ọnụ megide gọọmenti ha ma ọ bụrụ na ha etinyeghị n'ọrụ, iwu mmachi ndị mbịara mbịara na-azụ ahịa mgbere.

Onyeisi otu ahụ bụ Joseph Obeng kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọbụla ọnwa atọ zuo, "ndị otu anyị ga-awuju ezi ime ngagharịiwe.

Image copyright Kwesi Debrah/Luv FM
Nkenke aha onyonyo Otu n'ime ọdụahịa ha gbachiri na Kumasi

" Ọchịchị obodo abụghị okwu nwanne na nwanne, ka asị na Gana na Naijiria bụ nwanne, i nwezie iwu, ị gaghị etinye ya n'ọrụ."

Na nkọwa ya otu onye n'ime ndị ndu otu jikọrọ ndị Naijiria na-azụ ahịa na Gana a kpọrọ 'Nigerian Union of Traders Associations', (NUTA) bụ Kizito Obiora kwuru na Ọ bụ ezie na ndị Gụta majara na-aga eme ngagharịwe.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Mkpagbu ndị Gana na-akpagbu anyị o nweghị onye na-ebe ya ndị Ghana na Naijiria'

Ebe niile bidoro kpọwa ghara ghara kemgbe Monde ka a ga-asi na ọgbaghara achọrọ ịda n'etiti ndị ahịa Gana na ndị nke Naijiria n'Ahịa Opera Square dị n' Akra, Gana.

Obiora gwara BBC Igbo na 'ha kpọchiri ọdọahịa ụmụ Naijiria ụbọchị Monde mana gọọmenti ha na ndị uweojii mere a gbapekwa ya ụnyahụ (Wenezde)."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionProf Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ

"Gọọmenti ha gwara anyị na ha ga-echekwa anyị mana anyị ahụghị isi nkwa ahụ mana oge rue ndị obodo ahụ achụgharị anyị merụwa ndị mmadụ ahụ, mebisia ahịa anyị."

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka gọọmenti Naijiria na nke mba Gana nwekọ mkparịtaụka iji mee ka nsogbu ahụ bịa na njedebe.

Akụkọ ga-amasị gị: