Real Madrid vs atlético Madrid: Bale ga-akwakọrọ ngwongwo ya laa China ka eziri ha onye bụ oke

Diego Costa Image copyright Reuters

Diego Costa gosiri ihe ojiri bụrụ onye egwu ọpụrụiche ka onyere ọkpụ goolu anọ iji nyere Atletico Madrid aka tie ogbo ha bụ Real Madrid ezigbote ihe na obodo New York.

Costa - bụ onye emechara chụpụ n'asọmpị ahụ - nọ n'isi ọkpụ asaa Atletico ji sị Real na ọ bụ ha bụ eze Madrid.

Dani Carvajal nke Real Madrid natakwara akwụkwọ mee mee ka anya chawara ndị agba bọọlụ ọbara ọbara na ya bu asọmpị.

Real chịtara sọsọ aja atọ mana nke ahụ agaghi ịkasị ha obi maka nke a bụ asọmpị atọ n'aghịrị ha ejighi mmeri laa.

Image copyright USA TODAY Sports

Nke a na-abịa na-azụ Bayern Munich na Arsenal gbara ọkpụ abụọ ọkpụ ọkpụ abụọ na-egwuregwu Gareth Bale nyere otu goolu.

Okwu Gareth Bale banyere asọmpị a maka ọkwakọwala akpa ya na nkwado ịga otu egwuregwu Jiangsu Suning nke china.

O nwere nkwekọrịta ịnọ afọ atọ ebe ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bale si na ọpụpụ ya bụ "Maka ọdinma mmadu niile"

Zinedine Zidane bụ onye nkuzi Real Madrid kwuburu na ọ ga-akara mmadụ niile mma ma nwaamadị a chọrọ ụzọ ya.

Cheta na Bale bidoro gbawara ndị otu bọọlụ Real Madrid Bọọlu na 2013.

Ndị otu bọọlụ Jiang Suning ga-akwu Gareth Bale otu nde Pounds kwa izu.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEgwuregwu na-amasi anyị

Isiokwu Ndị Emetụtara