Shia in Nigeria: Ịkpọ anyi ndị oyi egwu agaghị abara gọọmentị uru ọbụla - Onye Shia

'Yan Shia Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Shia na-eme ngaghari iwe kemgbe 2015

Onyeisi ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) nke Ọdịda Anyanwu nke Naịjirịa bụ Muftau Zakariya gwara BBC na akụkọ na gọọmentị chọrọ ịkpọ ha otu na-eyi obodo egwu adịghi amapụha obi.

Muftau Zakariya na-etinye ọnụ na-akụkọ ụlọ ntaakụkọ Punch dere sị na ụlọikpe ukwu n'Abuja kpebiri na ndị Shia so n'otu na-eyi obodo egwu - bụ nke Bekee kpọrọ "terrorist group".

Muftau Zakariya jụrụ; "ọ bụ gini mere gọọmetị erubehị isi mgbe ụlọikpe nyere iwu ka atụhapụ Ibrahim El-Zakzaky?"

Ọ jụkwara ma ọ bụzi iwu mmachi ha ka gọọmentị ga-erubere isi?

Ọ ga-kwara n'ihu kwuo na uche ya bụ na ihe bụ usoro gọomentị ji chọrọ ịmachị ha.

"Ya bụru na ha sị na anyi bụ ndị oyi egwu, ịmara na onye ọbụla bụ onye Shia bụ onye oyi egwu. Nke a metụtara ma ndị uweojii, ndị na-arụ ọru dị iche iche nakwa ndi so na gọọmentị bụ ndi Shia."

Mufta kwuru na imachi ha dịka imachi ngalaba ndị nke kraịst dika Catholic ma o bụ ndị Ama Jehova.

Nkenke aha onyonyo Zakzaky malitere otu IMN mgbe ọ bụ nwata akwụkwọ na Mahadum ABU

Okwu ịmachị otu a bidoro fegharịwa ka ha na ndị ọrụ nchekwa na akwakọ isi n'Abuja dịka ha na-eme ngagharị iwe maka okwu Ibrahim el-Zakzaky.

El-Zakzaky nọ n'aka gọọmentị kemgbe afọ 2015.

Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere ubọchị 22 nke ọnwa Jụlaị na gọọmentị na-ahazị ịmachị ya bụ otu.

Muftau Zakariya gara n'ihu kwuo na ụjọ adighị ha ma kwuo kwa na ha dị njikere inwu maka nzọpụta onyeisi ha ma na ajụ kwa gọọmenti etiti na ha enwere ụlo mkpọrọ ka ajide ndị otu ha ruru mmadu nde iri na atọ.

BBC gbara mbọ ịnwete ndị na-ekwuru gọọmentị ka ha kwuo ma atụmatu a akuko sị na o si ụlọikpe pụta ọ bụ eziokwu, mana Garba Shehu, Femi Adesina na Laulu Akade asaghị mgbe ekwenti ha dara.

Bashir Ahmad, bụ onye na-enyere Onyeisiala Muhammadu Buhari aka n'ihe banyere mgbasaozi agba ọhụrụ, gwara BBC na ya amaghị maka ya bụ atụmatụ.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ngagharị iwe ndị Shia na-eme

"Anyi ka si Liberia bata. Ndị ga-ama maka ya bu ndị ọru ikpe."

Ya bụ, BBC ka na-eme nchọpụta ma akụkọ ọ bụ eziokwu.

Dika Muftau Zakariya sị na ndị Shia dị nkwadobe ime ike ha ma hụ na onyeisi ha pụtara, ihe ji agadi n'ukwu ka jikwa ya.

Ọtụtụ mmadu anwụọla site na ya bụ ngaghari iwe dịka ndị Shia na ndị ọrụ nchekwa na-akwakọ isi - N'ime ha bụ onyeisi ngalaba "Operations" n'Abuja bụ DCP Usman A.K Umar, onye ntaakụkọ Channels nakwa ndị ofufe Shia.

Akụkọ ka na-abịa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja

Isiokwu Ndị Emetụtara