Onitsha Truck accident: Ndị Uweojii anwụchiela ọkwọụgbọala gwongworo dagburu mmadụ abụọ n'Onitsha

Ụgbọala kpụpịara n'ihe mberede Image copyright Getty Images

Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na aka ha akparala ọkwọụgbọala gwongworo dagburu mmadụ abụọ n'Ọnịcha, Anambara steeti.

Ọkụekwe ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, onye gwara BBC Igbo nke a, kwukwara na ihe mberede ahụ mere oge gwongworo ahụ na-agbalị ịghọ onwe ya ada.

"Ọ dakwasara keke abụọ na otu ụgbọala na-ebu ndị mmadụ ka ọ na-eze ụzọ ọjọo."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEbe e nwere uchu,olileanya dị.

"Mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ụgbọala na-ebupu nke dachiri ụzọ akpụpụla ụgbọala ndị ihe mberede ahụ metụtara, ebe niile dekwara jụụ n'okporoụzọ ahụ ugbua.

Isiokwu Ndị Emetụtara