Ndị dọkịta India achịpụtala ego igwe, ọla, n'ime afọ nwaanyị na-eri ya

Nwaanyị na-ele ọla anya Image copyright Getty Images

Ihe mgbagwoju anya mere n'otu ụlọọgwụ n'India dịka ndị dọkịta chịpụtara ngwongwo na ngwongwo n'ime afọ otu nwaanyị.

Ndị dọkịta chịpụtara ihe nyịruru kilogram 1.5 gụnyere ma ọla nakwa ego igwe, n'ime afọ nwaanyị ahụ n'ụbọchị Wenezde, Julaị 24.

A kpọtara nwaanyị ahụ n'ụlọọgwụ ka nne ya chọpụtara na ọtụtụ ihe na-efu n'ụlọ ha, ma ghọta na ọ na-agbọkarị agbọ oge ọbụla o richara nri.

Dịka nne nwaanyị a siri kwuo, ahụ adịchaghị nwa ya nwaanyị (ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ isi), nke mere ka ha na-elekọta ya n'ime ọnwa abụọ ọ na-arịa ọrịa, mana ọgwụ e nyere ya arụghị ọrụ.

Nwaanyị ahụ na onwe ya kwuru sị na ọ bụ agụụ mere o ji na-eri ihe dịka ọlantị nakwa ego igwe na ihe ndị ọzọ.

Gịnị na gịnị ka e wepụtara?

Siddharatha Biswas bụ onyeisi ngalaba ndị na-awa ahụ n'ụlọọgwụ Rampurhat Government Medical College, kwuru na mgbakọ ego igwe ha chịpụtara pụtara 90.

O kwukwara na ha chịpụtara ihe ndị dịka ọla a na-agba n'imi, ọlantị, ọlaaka, elekere mgbanaka, ọla a na-anya n'olu nakwa ihe ndị ọzọ.

Kama ndị dọkịta kwuru na ha na-ele ya ọrịa dịka onye na-arịa ọrịa ụbụrụ isi.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị

Isiokwu Ndị Emetụtara