Anyị agaghị amachị ndị Shia ife ofufe ha - Buhari

Zakzaky
Nkenke aha onyonyo Eji Sheikh Ibrahim El-zakzaky kemgbe afọ 2015

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na atụmatụ ụlọ ikpe ukwu dị n'Abuja weputara maka otu akpọrọ "Islamic Movement of Nigeria" (IMN) abụghi maka ndị ofufe Shia.

Ụlọikpe ahu n'Abuja kpebiri na gọọmentị Naịjirịa nwere ikike itinye aha IMN n'ime akwụkwọ ndị na-eyi obodo egwu - Bu nke Bekee kpọrọ "Terrorists".

Ndị otu IMN - bụ otu ndị ofufe Shia - na-eme ngagharị iwe kemgbe afọ 2015 gọọmentị Buhari nwụchịkọrọ onyeisi ha bụ Ibrahim el-Zakzaky.

Gọọmentị ji el-Zazkzaky agbanyeghi na ulọikpe enyela iwu ka atụghapụ ya.

Dayo Akata bụ onyeisi ndị ọkaiwu Naịjirịa gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ụlọikpe enyeal ha ikike imachị otu IMN.

Mana, ọnu na-ekwuru ndị IMN bụ Ibrahim Musa gwara BBC na ha amatabeghị maka atụmatụ a, mana ya bugoduru eziokwu, ọgaghị eme ka ha kwụsị ime ngagharị iwe maka onyeisi ya e ji.

Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ha ga-esoro ihe ụlọikpe kwuru maka IMN, aman onweghi etu atumatu ahu ji metụta ndị ofufe Shia.

"Enwere nde kwa nde mmadu sonyere n'ofufe Shia na Naịjirịa achọghị nsogbu ma ncha. Gọọmentị na ha adịghị ese okwu. Onweghi onye ga anọchịrị ndị a n'ụzọ ime ofufe ha," bụ ihe Maazị Shehu kwuru.

O kwuru na ọ bụ "ịmachị ihe IMN na-eme ka gọọmneị chọrọ ime."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Abubakar Malami bụbụ Minista na-ahụ maka Ikpe na Onyeisiala Buhari

Ihe Ụlọikpe Kwuru

Akwụkwọ si ụlọikpe Ọkaikpe Tionye Maha kpebiri na "site ugbua gawa, onweghi ihe mere a ga-eji nye ụfọdụ mmadu ohere ịkpọ onwe ha Shia."

O kwuru na ụlọikpe nabata arịọrịo onwetere ịmachị otu ahụ si n'aka gọọmentị etiti Naịjirịa.

"N'iji machie otu a, ulọikpe na-enye Minista na-ahụ maka ikpe iwu ka edepute imachi a n'ime akwụkwọ mgbasa ozi abụọ dị na Naịjirịa."

Ndị IMN malitere ime ngagharị iwe n'afọ 2015 n'Abuja nakwa ebe ndi ọzọ na Naịjirịa.

N'izu gara aga, mmadụ 11 so n'otu ahụ nwụrụ mgbe hau na uweojii zutere.

Ndị uweojii na-ebokwe ha na ha gburu otu onyeisi ndị uweojii n'Abuja.

A na-ele anya na gọọmentị Naịjirịa maọbụ ngalaba na-ahụ maka ikpe ga-ekwupute mmachị IMN.

Nke a mee, IMN ga-abụru otu abụọ gọọmentị machịrị, dịka ha machiri otu "Indigenous Peoples of Biafra" nke eji Ipob mara n'afọ 2017.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a