Milk Importation Restriction: Lee ihe i ga-eji tichie mmiri ara ehi

Nrị ga anọchịte Mmiriaraehi

Gọọmentị Naịjirịa na-akwado ịkwụsị inye ndị na-atụbata mmiri ara ehi ego ofesi nke ha sị bụ iji inyere ndị na-emepụta nri ahụ na mba ha aka.

Ọtụtụ mmadụ na-eche na ụkọ na ego ya ịrị elu bụ ihe nwere ike soro ya bụ atụmatụ n'azụ.

Atụmatụ a mere ka ụfọdụ ndị na-aju sị: "Kedu nnọchịte anya mmiri ara ehi?"

N'ịsa ajụjụ a, matakwa na mgbe gboo, mmiri ara ehi abụghị ejirimara Igbo.

I lee anya, I ga-ahụ na enweghị nri Igbo eji mmiri ara ehi esi.

Kama ka obodo na-emepe, ndị Igbo bidoro jiri mmiri ara ehi esi ụfodụ erimeri.

Ngwa lee ụfọdụ nri enwere ike iji mepụta nnọchite mmiri ara ehi:

1) Mmiri agwa soya:

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ihe ọṅụṅụ eji Soya mee na a dị mma n'ahụ

Soya bụ udiri agwa nwere ike nọchịte anya mmiri ara ehi.

Ndị mmadu n'eji ya esi nri ma na apịpụtakwa mmiri ya maka iji mee ihe ọṅụṅụ a na akpọ "Soy Milk" na bekee.

Mmiri Soya bụ ezigbote nnọchite anya mmiri ara ehi n'ihi na ọ nwere ọtụtụ ihe dị na mmiri ara ehi ma karia.

Ngalaba nchọpụta a na-akpọ "Federal Institute of Industrial Research" (FIIRO) nke dị n'okpuru Mịnistirị nke Sayens na Technuzu ekwuola na mmiri soya nwere ọtụtụ ihe n'edozi ahụ.

2) Mmiri apịpụtara n'akoyibo:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Igbo nwere akịoyibo

Akịoyibo juputara n'ala Igbo nille.

A na-ata ya ata ma na eji kwa ya eme ọtụtụ ihe.

Akịoyibo nwere otutu erimodo nke mere na mmiri apịpụtara na ya nwere ihe na-edozi ahu.

BBCgoodfood na-akọwa na e nwere ike iji mmiri apịpụtara n'akioyibo nọchite mmiri ara ehi ma kwuo kwa na o nwere abụba n'ime ya nke a na-akpọ "Lauric Acid" nke na-egbu otụtụ nje na ebute ọria n'ahụ mmadụ.

3) Mmiriapịpụtara n'osikapa :

Nkenke aha onyonyo Osikapa

Ebonyi steeti na Enugu steeti bụ steeti ndị nọ n'ọwụwa anyanwụ kacha akọpụta osịkapa.

Kama mmirri apịpụtara n'osikapa anaghị ewu ewu n'ala Igbo.

Mmịrị a na-atọ bịrịbịrị ma na onweghị ọtụtụ ihe n'edozi ahụ.

Mmiri apịpụtara n'osikapa nwere ike inọchite mmiri ara ehi maka ndị mmiri ara ehi anaghị amasị.

4) Mmiri apịpụtara na kashuu:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ere Kashụụ n'okporo ụzọ Naịjịrịa

Abia, Enugu na Imo bụ steeti kachaa nwee Kashuu n'ala Igbo.

Mmiri apịpụtara na Kashuu na-adị mma maka ahụike anya, obi nakwa anụ ahụ mmadụ.

Ọ naghị atọcha ụtọ nke mere ka ụfọdụ mmadụ na-etinye ya mmanụ aṅu.

5) Mmiri apịpụtara n'ahụekere:

Image copyright SPL
Nkenke aha onyonyo E nwere ọtụtụ nrị e ji ahuekere esi n'ala Igbo

Ahuekere bụ nri mara ndị Igbo ahụ.

Igbo na-ahụ ya n'ọkụ maọbụ esie ya esi.

Ụfọdụ na-ejikwa ya esi ofe mana ọtụtụ amaghị na enwereike iji ya mee nnọchite mmiri ara ehi.

A na-akọ ya n'ala Igbo mana ebe a kacha akọ ya bụ na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Mmiri apipụtara n'ahụekere nwere ufọdụ ihe ọ na-enye n'ahụ nke na-adighị na mmiri ara ehi dịka Vịtamịn E, Vịtamịn B6 na ọtụtụ abụba nke na-edozi obi.

Nke a pụtara na onye obi na-amapụ dọrọ duu.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara ahuike bụ Ikenna Onoh nyere ndụmọdụ na ndị okenye nwere ike iji nri ndị ọzọ dịka azụ na akwa were mezue ihe ndị dị na mmiri ara ehi nke na-adịghị na nri ndị a.

Mazi Onoh kwukwara na-ọka mma ka ndị nne na nna jụọ dibia oyibo ma ọ bụ onye n'ahu maka erimeri tupu ha ewere nrị ise ndịa nochie anya mmiri ara ehi ebe ụmụ ha nọ.

Na nchịkọta, BBC mere nyocha na Briten were hụ na n'Briten niile, nanị madu 25% na-eji mmiri na-abụghị mmiri ara ehi eri nri ebe ndị mmadu 42% na-aṅụ mmiri ara ehi.

N'aka nke ozọ, ha chọpụtara na mmadụ 42% ji ya anụ tii na ihe ndị ọzọ ebe 82% ji mmiri ara ehi aṅụ nke ha.

Lee ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOfe onugbu

Isiokwu Ndị Emetụtara