Ministerial screening: Ka o sị a ga n'ụlọomeiwu ukwu taa

Ụlọomeiwu ukwu amalitela ime nnyocha nke agba abụọ maka ndị onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ga-abụ Mịnịsta n'ọchịchị ya.

Rauf Aregbesola chịburu Osin steeti Image copyright @RaufAregbesola/Twitter

Na mbido okwu ya, ọ o kelere Rochas Okorocha ekele pụrụiche maka ọrụ ya n'otu APC.

Ndị ọzọ ọ kelekwara gụnyere Adebisi Akande, Segun Osoba nakwa Ahmed Tinubu.

O kwuru na n'agbanyeghị ụkọ ego dị na steeti Osun mgbe ọ nọ n'ọkwa, na ọ gbara mbọ hụ na ndị ọrụ gọọmentị ka na-eri ụgwọ ọnwa.

Babatunde Raji Fashola

Image copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo Fashola jị ngalaba atọ achịkọtara ọnụ na gọọmentị Buhari

Mịnịsta hụburu maka ọkụ na ụlọ na Naịjirịa bụ Babatunde Raji Fashola bụ onye mbụ enyochara n'ụbọchị Mọnde.

Sinetọ Rochas Okorocha so na sinetọ karịrị iri abụọ na asatọ gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ihe o mere na mbụ na ihe ọ na-akwado ime ugbua ahọpụtarala ya ọzọ.

Mgbe Okorocha jụrụ maka etu Fashola ga-esi chịkọta ego ọ ga-eji mepụta ihe na mịnịstrị atọ achịkọtara nye ya, Fashola kwuru na ọ ga-adị mma ka ụmụ Naịjirịa na-atụkọta kịrị kịrị ego akpọrọ "infrastructure fund" nke ga-enye aka.

Sinetọ Uche Ekwunife jụrụ ihe mere okporoụzọ sị Enugu gawa Onitsha ji bụrụ ihe a na-arụ ebighe ebi, Fashola gwara ya na ego kọ ndị ọrụ n'aka ha kwụsị ọrụ mana ya ga-ahụ na-enwetere ogbugbu maka ya bụ okporoụzọ.

Ka ọ zakatara ajụjụ nnyocha a na-eme ya, Sinetọ Oluremi buru bata na-ayọ ka Fashola nye ndị mpaghara dị iche iche ohere irụ ọrụ na ministri ya.

Nke a mere ndị mmadụ ji sewe ihu n'elu soshal midia.

Muhammad Mahmood si Kaduna steeti

Ihe gbagojuru ụwa anya bụ ka ndị sinetọ si mee kwam kwam wee si mịnịsta si Kaduna ya pụwa ghara ijụ ya ajụjụ ọfụma.

Gbemisola Saraki si Kwara steeti

Mgbe o ruru oge Gbemisola Saraki, ndị sinetọ kworo makana ọ bụbụ onye otu ha nye ya naanị ndụmọdụ ka o mee ka mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti etiti na ụlọomeiwu ukwu na-aga siriri werere.

Onyeisi Sineti bụ Lawan Ahmed kwuru na ya na ndị otu ya ga-aga obere ezumike ma chịghata azụ n'elekere abụọ iji metọpụ ya bụ nnyocha.

Akukọ ndị ga-amasị gị: