Abubakar Shekau ọ bụzị anwụanwụ?

Abubakar Shekau Image copyright AFP

O meela afọ iri kamgbe ndị otu Boko Haram bidoro kpawa ike ọjọọ na Naịjirịa, na-egbu ndị mmadụ, na-atụ ogbunigwe, ma na-atọrọkwa ndị mmadụ.

Nke a bidoro dịka ndị uwe ojii gbuchara onye malitere otu ahụ aha ya bụ Mohammed Yusuf n'afọ 2009.

Kamgbe ahụ, puku kwuru puku mmadụ anwụọla n'aka ndị otu ọjọọ a akpọrọ Boko Haram, tụmadị na mpaghara ugwu Naijiria.

Ndị agha ndị Naijiria nakwa agba mbọ kamgbe ahụ iji kwụsị ya bụ otu, mana onwebeghi isi.

Ugboro ugboro ka ndị isi ndị agha Naijiria kwuru na ha egbuola Abubakar Shekau bu onye isi ndi Boko Haram.

Mana ha ncha bụcha asị asị n'ihi na Shekau ka dị ndụ ebe ndị otu ya ka na-eyi Naijiria niile egwu.

Lee ugboro ise e kwuru na Shekau anwụọla:

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Abubakar Shekau kwuru na ọ chọrọ ịkewara obodo nke aka ya ebe onye ọbụla ga
  • Nke mbụ bụ n'afọ 2009 mgbe ndị orụ nchekwa Naijiria wakporo ndị Boko Haram ma gbuo ihe ruru narị mmadụ n'ime ha. Ha kwuru na Shekau so n'otu n'ime ndị ahụ e gburu, mana oteghi aka, ndị Boko Haram wepụtara ihe onyoonyoo gosiri na nwa amadị ahụ ka dị ndụ.
  • Nke abụọ bụ n'ọnwa Ọgọst 2013. Ndị agha Naijiria kwuru na ha na ndị otu ọjọọ ahụ kwatara. Ha kwuru na mgbọ tụrụ Shekau na ebe ọjọọ nke na onweghi ihe ga-eme ka ọ dị ndụ. Mana ka otu ọnwa gachara, a hụkwara Shekau na ihe onyoonyoo ndị Boko Haram ebe o kwuru na onweghi ihe ọbụla mere ya.

Dapchi: Gọọmenti emeribeghi Boko Haram - Massob

'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa

Boko Haram ji 'drone' enyo anyị - Ndị agha Naịjirịa

  • Ọzọkwa, n'afọ 2014, ndị agha Naịjirịa kwuru na ha agbagbuola Shekau n'ọgụ ha na ndị Boko Haram lụrụ na Konduga. Ndị agha mba Cameroon sokwara kwuo na nke ahụ bụ ezịokwu. Ha gakwara n'ihu wepụta foto otu onye nwụrụ anwụ ha sị na ọ bụ Shekau.
  • N'afọ 2015, onyeisiala nke mba Chad bụ Idriss Deby kwuru na nke Boko Haram agaala n'ihi na onyeisi ọzọ ewerela ọchịchị n'aka Shekau maka na ọ laala mmuọ.
  • N'afọ 2016, ndị otu agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n'ebe Shekau na ndị otu ya zoro. Ha kwuru na Shekau merụrụ nnukwu ahụ nke na ọghaghị ịnwụ.
Image copyright Boko Haram
Nkenke aha onyonyo Boko Haram mechara kewaa ụzọ abụọ

Ka ọ dị ugbua, otu ndị Boko Haram agbakeela ụzọ abụọ, otu ụzọ gaa dịnyere ndị otu oyi egwu nke mba Iraq a kpọrọ ISIS.

Ihe Buhari gwara ndị agha na Maiduguri

Hapụrụ anyị ụmụ anyị - Aisha Buhari

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAgaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere

Ha na-akpọ onwe ha "Islamic State in the West African Province" (ISWAP).

Image copyright AFP

Cheta na ọ bụ ndị otu ọjọọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị 276 n'ụlọakwụkwọ ha na Chibok, Borno Steeti, n'afọ 2014.

N'afọ 2018, ndị Boko Haram tọrọkwaara ụmụakwụkwọ otu narị na ise n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti, mechaa tọhapụ ha.

Mana otu onye n'ime ụmụakwụkwọ ahụ aha ya bụ Leah Sharibu ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram.

Akụkọ kwuru na gọọmentị kwụrụ Boko Haram nnukwu ụgwọ tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ, mana gọọmentị ka na-agọ agọ.

Akụkọ na ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ