Islamic Movement of Nigeria : Ihe itoolu e ji ama otu ndị oyiegwu

Mohammed Adamu na El-Zakzaky Image copyright NPF/IMN

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na gọọmenti etiti amachiela otu ndị na-ekpe Alakụba a kpọrọ Islamic Movement in Nigeria (IMN) nke onye ndu ha bụ Ibraheem El-Zakzaky kpọmkwem.

Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu, onye kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere n'Abuja ụbọchị Tuzde.

Adamu kwuru na ndị uweojii ga na-ahụtazị otu Shi'ite dịka ndị oyiegwu dịka ụlọikpe siri kpebie.

Cheta na ụbọchị Fraide Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke ọkpaikpe Nkeonye Maha nọ n'isi ya nyere mkpebi n'akwụkwọ nke gọọmenti etitu gbara machiri otu IMN dịka 'otu na-eyi ndụ egwu.'

Mana ndi ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa na-ekwu na mmachi a machiri ndị Shia agbasoghị usoro ọchịchị onyekwuouche ya.

Uzoma Anyakora, onyeisi ụlọọrụ 'Spider Security' kwuru na "gọọmenti soro bute ọgbaghara ndị Shia ebe ụlọikpe nyere iwu ka a hapụ onyeis ha, ha jụụ ịhapụ ya."

Amnesty International katọrọ mmachị ahụ si na o megidere ikike ịgbakọ nakwa nke mmadụ ikpere chi masiri ya nakwa.

Lee njirimara otu oyiegwu

Lee ihe ndị ị ọ ga-abụ ịhụ ị mara na otu bụ ndị oyiegwu, dịka otu UNOC siri kọwaa

1. Ha na-akpa mkpamkpa dịka ogbugbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ,isunye mmadụ maọbụ akụnaụba ọkụ na mpụ ndị ọzọ yiri ha

2. Ha na-achọ ime ka ọha na-atụ ha egwu

3. Ha manye gọọmenti ka ha mee maọbụ hapụ ime ihe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBiafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu

N'otu aka ahụ, Anyakọra kwuru na njirimara ndị oyiegwu

4. Ha bụ otu na achọ mkpa nke onwe ha., ha anaghị achọ ọdịmma ọha

5. Ha bụ ndị ogbuaraọbara, ha na-achọ ịna-akwafu ọbara

6. Ha amaghị Chukwu nke ha naenwe obi mmadụ

7. E nyeghị ihe ha na-akpa ha, ha achọ igbu mmadụ

8. Ha na-enweta nkwado site na ndị mmadụ maọbụ mba ndị ọzọ

9. Mkpamkpa ha na-eme ndị mmadụ anaghị enwe ịkpe aga ebe ndị ha chọrọ ịga.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?