Emeka Ihedioha : Anyị niile bụ nwanne na PDP

Emeka Ihedioha Image copyright Emeka Ihedioha/Facebook

Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha ekwuola na otu PDP na steeti ka bụ otu n'agbanyeghị mpụtara ikpe Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa nyere gbasara onye ji ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019.

Ulọikpe kachasi na Naịjirịa nọrọ ụbọchị Tuzde kpebie na ikpe amaghị Ihedioha n'akwụkwọ nke Senetọ Samuel Anyanwu gbara nke o boro ebubo na PDP Imo steeti họputa Ihedioha n'ụzọ ezighị ezi ịzọ oche gọvanọ Imo steeti.

Ihedioha egosiri obi ụtọ ya na mmeri nke Ụlọikpe Kachasị nyere ya ma rịọ ka ndị Imo steeti niile, n' agbanyeghị otu ndorọndọro ọchichị onye nọ na ya, gbakọta bia tinye aka ka ha dozie Imo steeti.

N'okwu ya site n'ọnụ onye nnyemaka pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Ihedioha bụ Steve Osuji, o kwuru na "na-agbanyeghị na ha nabatara ikpe a, na ihe mere bụ n'etiti umunne."

"Anyị bụ otu n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEmeka Ihedioha: M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti

O kwukwara na ha nwere olileanya na ikpe agaghị ama ha na akwụkwọ niile a gbara ha ka dị n' ụloikpe.

Ebubo a bidoro dịka Ihedioha jiri votu 1,723 were merie Anyanwu onye nwetara 1,282 n'onwa Oktoba n'afọ 2018 mgbe ndị PDP nke Imo steeti mere nhọputa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri '

Onye ọkaikpe John Okoro kara ikpe a were si "onye gbara akwụkwọ enweghị ike igosi na ebubo ya bụ eziokwu nke mere na ikpe ya esighị ike"

O kwukwara na "Onye gbara akwụkwọ ga akwụ kwa onye ọ gbara akụkwọ N200,000 "