Second-hand cars: Ntụbata ụgbọala anyarala anya ga-emebi ahia anyị' - Innoson

Innocent Chukwuma Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Innocent Chukwuma

Ụgbọala anyarala anya bụ ezigbo ahịa na-aga ahịa na Naịjirịa nakwa gburugburu Africa.

Mba China dịka ha tetere n'ụra ọhụrụ wee sị ka ha soro mịta nnukwu akụ na ụba si na ya bụ ahịa apụta nke mere ka ha malite ịtụbata ụgbọala anyarala anya na mba Africa, Asia nakwa Europe.

Etu o si metụta Naịjirịa

Image copyright Innosonmotors.com
Nkenke aha onyonyo Innoson na-arụpụta ụgbọala dị ịcheịche

Ngụkọ pụrụiche na-egosi na nani ụgbọala anyarala anya melitere n'ogo pasenti iri asatọ (80%) ego si na azụmahia ụgbọala pụta na Naịjiịa n'afọ 2016.

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na atumaatụ a ga-amagbu onwe ya mana otu onye Igbo bụ naanị ụlọọru ya na-emepụta ụgbọala na-ekwu na ya bụ atụmaatu ga-emebiri ya ahịa.

Mana o kwuru na onweghị onye Naịjirịa ụta dịrị makana ego ụgbọala anyarala anya dị ọnụ ala.

Innoson kwuru na ọ bụrụ na onye na-emepụta ụgbọala na Naịjirịa ezi nkwado, ụgbọala ọhụrụ ga-eruteli onye ọbụla aka makana etu ihe si dị na Naịjịria ugbua anaghị enyecha ndị mmepụta ihe ohere irite uru dịrị ha.

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru gọọmenti n'ekwenti kpụrụ n'ala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: