Boko Haram insurgency: Meenu nnyocha maka ndịagha 1000 e liri na nzuzo – Atiku

Akụkọ ndị dị mkpa 1/8/2019:

Atiku: Meenu nnyocha maka ndịagha 1000 e liri na nzuzo

Atiku Abubakar na Ndịagha Naijiria Image copyright Getty Images

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 n'aha pati PDP bụ Atiku Abubakar akatọọla olili a na-ebo na e liri ndịagha nwụrụ na ọgbọ ọgụ Boko Haram na nzuzo.

Ụlọakụkọ 'Wall Street Journal' wepụtara akụkọ nke na-ebo ebubo na e liri ihe ruru ndị agha dị otu puku n'ogige ndị agha dị na Maidguri, Borno steeti iji gbuchie ihe ibu agha megide Boko Haram rierela Naijiria.

N'ozi ya n'igwe Twitter ya, Atiku onye kwuru na ọ bụ' ihe mgbawa obi izoro lie ndịagha nwụrụ na agwaghị ezinaụlọ ha,"ma kpọ oku ka e hiwe kọmịtị abụghị nke gọọmenti nke ga-enyocha ebubo ahụ.

N'akụkọ ahụ nke Wall Sttreet Journal dere, otu onye agha akpọghị aha ya kwuru na : "E liri ọtụtụ ndị otu anyị n'ili n'abalị."

"Ọtụtụ na-anwụ nke a na-eme ka ọ dị ka ha abịaghị ụwa."

Ndị dọkịta ewepụtala eze karịrị 500 n'agba otu nwata

Nkenke aha onyonyo Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ kwuru na agba na-afụ ya ụfụ

Ndị dọkịta na mba India ewepụla ihe karịrị eze narị ise na ọma n'ọnụ otu nwata nwoke dị afọ asaa.

Nkenke aha onyonyo Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ kwuru na agba na-afụ ya ụfụ

Ha chọpụtara nke a dịka nwata ahụ gara ụlọọgwụ n'afọ gara ebe agba ya na-egbu ya mgbu ma koo eko.

Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ eze ndị a wepụtara n'ọnụ nwata ahụ

Igwe nyocha bụ 'X-ray' gosiri ihe dị ka anụ ahụ ebe eze karịrị narị ise dị n'eze nwata ahụ.

Ha wara nwa ahụ ọnụ n'ihe ruru elekere ise tupu ha enweike weputa eze ndị ahụ.

Lee ya n'ihe nkiri a:

Chukwueze esonyerela otu 'Roc Nation Sports'

Image copyright Twitter/Roc Nation Sports
Nkenke aha onyonyo Chukwueze ebinyela aka n'akwụkwọ isonyere Roc Nation Sports

Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwuezu nọzị mma na-ekwe oyooyoo ugbua dịka o sonyeerela ụlọọrụ 'Roc Nation Sports.'

Roc Nations Sports bụ nnukwu ụlọọrụ na-elekọta ndị egwuregwu dị icheiche nke onye nwe ya bụ otiegwu a ma ama aha ya bụ Jay Z.

Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n' akara Twitter ha ụbọchị Tọzde, na-eto Chukwueze dịka otu n'ime ndị ntorobịa bụ ọkacha agba bọọlụ na mba Afrịka.

Ka ọ dị ugbua, Chukwueze esonyerela ndị dịka Romelu Lukaku na Eric Bailly nke otu egwu Manchester United dịka ndị ụlọọrụ ahụ na-elekọta anya.

APC apịachiela akwụkwọ n'ụlọikpe

Image copyright Twitter/Bayo Omoboriowo
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo

Akụkọ sị Abuja pụta taa kwuru na ndị otu APC akpọghị onye akaebe ọbụla n'ikpe dị n'etiti Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar gbasara onye meriri ntuliaka nke 2019.

Cheta na Atiku na ndị otu ya bụ PDP gbara Buhari na ndị APC akwụkwọ na-ebo ha ebubo nrụrụaka na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa March.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Obi adịghị Okorocha mma

Image copyright PIUS UTOMI EKPEI
Nkenke aha onyonyo Okorocha kwuru na naanị ihe Ihedioha chọrọ bụ ka ọ metọọ aha ya.

Aka chịburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha agbarụọla ihu maka mweghara gọọmentị Imo weghaara 'Eastern Palm University' nke bụ otu n'ime mahadum ọ rụrụ tupu ọ rituo n'ọchịchị.

Kọmiti nke gọvanọ Emeka Ihedioha hibere gbasara nkea kwuru na Imo steeti enweghị ego iji lekọta imirikiti mahadum nke Okorocha sị na o rụrụ oge ọ bụ gọvanọ.

Ọrịa Ebola ka na-agbasakwa

Image copyright Reuters

N'ofesi, mba Rwanda emechiela oke dị n'etiti ha na mba Congo n'ihi egwu na ọrịa Ebola nwere ike ịbata n'obodo ha.

Nke a mere dịka a chọpụtara onye nke atọ nwere ọrịa Ebola na mpaghara Goma bụ Obodo ya na Rwanda nwere oke ala.

United Nations: Mmadụ 27,000 anwụọla n'afọ iri Boko Haram kpaarala ike

Nkenke aha onyonyo Ogige ebe ndị gbara ọsọ ndụ n'Ọdịdịda-Anyanwụ Ugwu, Naijiria.

Otu United Nations ekwuola na nsogbu Boko Haram ataala isi opekata mpe mmadụ n'afọ iri ha merela mkpamkpa n'Ọdịdịda-Anyanwụ Ugwu, Naijiria.

UN kwuru nke a n'ọgbakọ ha na ndị otu ndị ọzọ na-enyere mmadụ nkwado mere na Abuja iji tulee ihe merela n'afọ iri ndị Boko Haram kpara ike.

Ha nọrọ ebe ahụ kwee nkwa ị ga-n'ihu ịkwado ndị gbara ọsọ ndụ n' Borno,Adamawa na Yobe steeti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

UN gbara ama ọgụ ndị Boko Haram emebichala ọtụtụ dị na steeti ndị ahụ, ebe ha tọọla ọtụtụ ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ha jiri mee nwunye na ndị na gbara ha ogbunigwe, ma manye ndị nwoke ka ha ghọọ ndị agha ha.

Boko Haram ka na-akpa ike na Naijiria na-agbanyeghị na gọọmenti etiti ekwuola na ha ekwopụla ha mpi.

Nwa Osama Bin-Laden alakwurula nna ya

Image copyright CIA
Nkenke aha onyonyo Cheta na gọọmentị mba Amerịka tụkwasịrị otu nde dọla n'isi ya maka onye nwere ike ịgba ama maka ebe ọ nọ

Akụkọ si mba Amerịka pụta na-akọwa na Hamza Bin-Laden bụ nwa nwoke onye bụbu onyeisi al-Qaeda bụ Osama Bin-Laden anwụọla.

Mana ha sị na ebe ọ nọ nwụọ maọbụ mgbe ọ nwụrụ edoghị anya.

Etu o si nwụọ edokwaghị anya, mana ntị ndị mmadụ tọrọ n'ala ịnụ akụkọ so ya.

Dangote emezuola nkwa o kwere Super Eagles

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Aliko Dangote bụ onye nwe Dangote Cement na ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche ichedịka ndị ọgaranya ndị ọzọ na-eme

Aliko Dangote emezuola nkwa o kwere Super Eagles ịkwụ ha puku dọla iri ise ($50,000) maka goolu ọbụla ha nyere n'egwuregwu ọkara-ikpeazụ.

Ndị Ọljiria mechara jiri 2-1 gbapụ Naịjirịa, n'agbanyeghi na Naịjiria nwetara otu goolu si n'ụkwụ Ighalo.

Cheta na Dangote na Femi Otedola so na ndị ọgaranya Naịjirịa a na-anụ aha ha, kwere ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa nkwa ego ka ha gara asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2019.

Ihe Umahi kwuru maka ndị nkuzi,

Image copyright EBONYI GOVERNMENT

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, etinyela iwu iji machie ntụfe ndị nkuzi site n'otu okpuruọchịchị gafee okpuruọchịchị ọzọ.

O kwuru nke a ka ọ na-akọwa na ebe ọ bụ na okpuruọchịchị obodo enwerela onwe ha n'ihe gbasara ego, na ha ga-akwụkwara onwe ha n'ihe gbasara ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

Naịjirịa na-atụbata ọgwụ 70%

Image copyright NAFDAC official Facebook
Nkenke aha onyonyo Ndị Nafdac machiri ụlọọrụ anọ maka nchọpụta BBC mere maka etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine ha na-arụpụta

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ a kpọrọ NAFDAC ekwuola na Naịjirịa na-atụbata ọgwụ n'ogo ruru ụzọ asaa n'ime ụzọ iri.

Mana onyeisi ha bụ Mojisola Adeyeye gara n'ihu dụọ ndị na-arụpụta ọgwụ na Naịjirịa ọdụ, kwuo ka ha gbaa mbọ hụ na ha meziri nke ha na-arụpụta ọfụma.

N'egwuregwu,

A nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ; nke a ka Andy Murray na Jamie nwanne ya nwoke gosiri dịka ha meriri n'egwuregwu tenis nke Washington Open.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ike Jamie na Andy Murray kpara ka ha nọkọrọ ọnụ pịa asọmpi Iko Davis nke mba Briten, nyere ha mmeri n'afọ 2015

Nke a bụ mbụ ha abụọ na-eso apịa tenis kemgbe afọ 2016.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

Isiokwu Ndị Emetụtara