Catholic Priest Killing: Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu

Onyeisi ndị Uweojii Image copyright NPF/
Nkenke aha onyonyo Mohamed Adamu enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu

Onyeisi ndị Uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka achọpụta ndị gburu Fada Paul Offu, bụ onyeisi ụkọchukwu St. James the Greater Parish Catholic Church, Ugbawka, Enugu steeti.

Ndị fada niile n'Enugwu Diocese mere ngagharịiwe ubọchị Fraide maka ogbugbu e gburu Fada Paul Offu nakwa ndị fada ndị ọzọ amabeghị ndị gburu.

A gbagburu Fada Offu na mgbede Tọzde oge ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke ya, dịka a gwara BBC Igbo.

Ndị ụkọchukwu Enugwu Diocese mere ngagharịiwe

Image copyright BBC Igbo
Nkenke aha onyonyo Ndị ụkọchukwụ na-eme ngagharịiwe n'Enugwu steeti sị na ha achoghi ndi ọchiehi na-egbu mmadu.

Ndị amabeghị ndị ha bụ gbagburu Fada Paul Offu ụbọchị Tọzde ka ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke n'Ihe, Enugwu steeti.

Mkpamkpa a mere ka ndị ụkọchụkwụ n'Enugwu 'Diocese' mee ngagharịiwe maka na enweghị ezi nchekwa n'Enugwu Steeti.

Lee ihe nkịrị a maka ngagharịiwe ndị ụkọchụkwụ a mere :

Ndị ntọ a tọrọla ndị ụkọchụkwụ ise nke "Redeem Church"

Image copyright PASTOR ADEBOYE/FACEBOOK
Nkenke aha onyonyo Ndị ụkọchụkwụ 5 nke 'Redeem Christian Church of God' abụrụla ndị nọ n'aka ndị ntọrị.

Ndị ntọ atọrọla ndị ụkọchukwu ụka 'Redeemed Christian Church of God' n'okporoụzọ Ijebu-Ode n'ụtụtụ Fraide.

Ndị ụkọchukwu ahụ na-aga ọgbakọ kwa afọ nke ndị ụka 'Redeemed' na-enwe n'ọnwa Ọgọstụ afọ ọbụla n'ogige ha a kpọrọ 'Redemption Camp' dị na Mowe, Ogun steeti.

N'Ofesi

Image copyright www.timomotosho.org
Nkenke aha onyonyo Achụọla Pastor Timothy Omotosho ọso ukwu eruala n'Saut Afrịka

Onye ndu 'Jesus Dominion International church' ama ama na Suat Afrịka bụ Timothy Omotoso abụrụla onye ndị mba Saut Afrịka gbaara ugbọ nwankpi .

Ha sị na ha achoghizi ihu ukwu ya na mba ahụ maka ebubo iwakpo nwanyị.

Ihe i kwesiri ịma maka nwafọ Naịjirịa Boris Johnson họpụtara

'Anyị agaghị akwụsị ngagharịiwe tutu a kwụsị igbu ụmụ Naijiria na Saut Afrịka'

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Harry Macquire gbara afọ 26 ga-ebido nyocha ahụ otu bọọlụ Manchester United

Ndị otu bọọlụ Manchester United ejirila ego ọkpụrụkpụ 'pound' nde iri asatọ were zuta Harry Macguire nke Leicester City.

Ka o si dị ugbua, Harry abụrụla onye nchekwa bọọlụ kacha daa ọnụ n'uwa niile.

Ndị agha Naịjiria agọrọla ọnụ ha n'akụkọ pụtara na ha na-atụbanye ma lie ndị otu ha Boko Haram gburu n'ili a na-arụbaghị ama.

Image copyright AFP

Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Onyema Nwachukwu kwuru sị na ndị ntaakụkọ ebe akụkọ a si pụta amaghị usoro dị n'ịkwa ozu onye agha Naịjirịa.

N'akwụkwọ ozi o kesara, o kwuru na usoro olili ndị agha gụnyere mbugharị, ikpe ekpere, ịgbapụrụ ha egbe nakwa ihe ndị ọzọ.

O kwuru n'ebe a na-eli ozu ndị ntaakụkọ boro ha ebubo maka ịtụnye ndị otu ha, bụkwanụ nke dị n'ebe a kpọrọ Maimalari Military Cantonment, ebe ndị agha na-eli ndị otu ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.

Cheta na ndị Wall Street Journal boro ha ebubo sị na otu onye agha Naịjirịa gwara ha na a "na-eli ndị otu anyị n'ili a na-arụbaghị ama n'ime abalị... ebe a ga-anọ echefu maka ha".

Ndị Agha Naịjirịa sị onye ọbụla kpọọ okwu ahụ n'imi, na ọ bụghị eziokwu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

Akụkọ ọzọ yiri ya:

Ihe ruru ndị agha iri abụọ na ise na ndị Islamic State iri anọ anwụọla na Borno steeti.

Ndị ma maka ọgụ a tara isi ha sị na o mere mgbe ndị otu Islamic State wakporo ogige ndị agha n'obodo Baga n'ụbọchị Monde.

Ka anyị tụọ ụkwụ n'ofesi,

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị nwetara ikike ịnya ụgbọala n'ọnwa Juun 2018

Ụmụnwaanyị Saudi Arebia ga-amalitezi ime njem si na mba fere na mba na-echeghi ka nwoke sị ha eh maọbụ mba.

Ọkwa ọhụrụ a enyekwuola ha ikike iji aka ha tinye akwụkwọ maka nwa ọhụrụ a mụrụ, alụmdinanwunye nakwa ịgba alụkwaghịm.

Lee ụzọ ise ụmụnwaanyị Igbo si dị iche na ndị nke ụmụnwaanyị mba Saudi .

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Pepe so otu egwuregwu Lille dị na mba Frans gafeta Arsenal

Nicolas Pepe nke mba Aịvọrị Kost abụrụla onye kacha akpata ego site n'ịgba bọọlụ nke mpaghara Afrịka dịka Arsenal kwụrụ nde paụnd iri asaa na abụọ iji zụta ya.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk

Isiokwu Ndị Emetụtara