Ebelechukwu Obiano: Ugegbe anya na-ese okwu

Ifeanyi Okowa, Ebele na Willie Obiano Image copyright Anambra Broadcasting Service
Nkenke aha onyonyo Ọ bụghị sọsọ Odozi akụ Obiano gara ya bụ akwamozu, mana ọ bụ ya pụrụiche maka kpọcha kpọcha enyo anya ya.

Nwụnye aka na-chị Anambara Steetị bụ Odozi Akụ Ebelechukwu Obiano na-ewu na soshal midia Naịjirịa maka enyo anya oyi gaa akwamozu n'Ihiala.

Akwamozu ahụ bụ nke Ichie Michael Chukwuka Onyema, bụ nna onye nwe ụlọ ọrụ ugboelu Air Peace bụ Maazị Allen Onyema emere ụbọchị Fraịde nke mbụ n'ọnwa Ọgọst 2019.

Ọbụghị sọsọ Odozi akụ Obiano na di ya bụ ndị ama ama gara ya bụ akwamozu, mana ọ bụ ya ka anya hụrụ ọfụma, maka kpọcha kpọcha enyo anya ha.

Agbenyeghi na onwere ụfọdụ na-eti mkpu maka ego ole ha na-eche na a na-ere ya bụ ugegbe, onwekwara ndị na-aja ya na ọ maka n'ihu nwụnye Governor Obiano.

BBC Igo nyochara ya bu enyo anya were chọpụta na ọ bụ ọpụrụiche ụlọ ọrụ Gucci - bụ ndị enyo mepụtara oyiri enyo anya ahụ - mere sọsọ 100.

Nke a pụtara ya bụrụ na ọ bu n'aka Gucci ka nwanyi mbụ n'Anambara gotere enyo anya ya, ọ nwereike iso n'ime 100 ahụ ha mepụtara n'usoro Bekee kpọrọ "Limited Edition Mask sunglasses with crystals".

Usoro mmepụta nke adịghị emepụta ọtụtụ bụ ihe Bekee kpọrọ "Limited Edition".

Mana lezia mgbe ọzọ Ebelechukwu Obiano kpịara enyo anya ọpụrịche:

Image copyright James Eze
Nkenke aha onyonyo Ebele Obiano dịka onye ugegbe anya na-amasị. Ebe a ọ nọ mba ofesi jir ya kwado uwe ndị ọcha
Image copyright James Eze
Nkenke aha onyonyo Ọ na adị jiri ya ahazị ejiji ya ma ọ na-apụta n'ọha. Ebe a, o ji ya kwado ikike ndị chiri echichi
Image copyright Emeka Ozumba
Nkenke aha onyonyo Ka a na-atụ ụmụ ada Anamabra ugo, Ebelechukwu Obiano dịka ka ọ na-adị
Image copyright James Eze
Nkenke aha onyonyo N'ụka, Ebelechukwu Obiano na di ya ji ugegbe anya oji chọọ ihu mma
Image copyright James Eze
Nkenke aha onyonyo Ka ọ na-anata asambodo, ugbegbe anya ya na uwe ya gbakọrọ nọ ka ha adị otu
Image copyright James Eze
Nkenke aha onyonyo Ugegbe anya na-amasịkwu Gọvanọ Obiano

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara