El-Zakzaky Release: Anyị ga-erube isi n'ihe ụlọikpe kpebiri - DSS

Akụkọ dị mkpa taa

Image copyright IMN
Nkenke aha onyonyo Sheikh Ibrahim Zakzaky

Ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Services' (DSS) ekwuola na ha ga-erube isi na mkpebi nke ụlọikpe nyere gbasara Ibrahim El-Zakzaky.

El-Zakzaky bụ onye isi ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) nke gọọmentị Naijiria kpọchiri ya na nwunye ya Zeenat kemgbe afọ 2015.

Mana ụlọikpe ukwu dị na Kaduna nọrọ n'ụbọchị Monde nye iwu ka a tọhapụ ha nwa mgbe nta ka ha gaa ụlọọgwụ dị na mba India maka okwu ahụike.

Ha nyekwara iwu ka ụfọdụ ndị gọọmentị soro ya gaa n'ụlọọgwụ, iji hụ na ọ ga-alọtakwa mgbe ọ natachara ọgwụgwọ.

Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii kwụchiri ebe e si aga ụlọikpe ebe a nọrọ kpee El-Zakzaky ikpe

N'akwụkwọ ozi ya, Peter Afunanya, bụ ọnụ na-ekwuru ndị DSS n'Abuja kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-akparịta ụka maka ịtọhapụ El-Zakzaky.

O kwuru sị, "Anyị anatala akwụkwọ iwu nke kwuru ka anyị tọhapụ El-Zakzaky.

"Anyị ga-agba mbọ irube isi n'ihi na anyị bụ ụlọọrụ na-asọpụrụ iwu."

Ndị otu IMN ewepụtalarị ozi ekele na ọṅụ iji kelee ndị niile gbara mbọ maka ntọhapụ onyeisi ha.

Image copyright Chimezie Ucheagbo

Cheta na ndị otu ahụ emeela ọtụtụ ngagharịiwe nke ha ji kpọkuo gọọmentị ka ha tọghapụ El-Zakzaky na nwunye ya.

Ngagharịiwe ndị ahụ tara ọtụtụ isi ndị mmadụ nke gunyere ndị otu ahụ, otu onye uweojii nakwa otu onye ọrụ ntaakụkọ.

Nke a mere ka gọọmentị etiti machie otu IMN dịka otu ndị oyi egwu.

Gọọmentị etiti na-ebo El-Zakzaky na ndị otu ya ebubo igbu mmadụ nakwa ibute ọgbaghara n'obodo.

Gọọmentị etiti etinyela ọnụ na ngagharịiwe

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu ekwuola na gọọmentị etiti akwadoghi ọkwa ngagharịiwe nke otu a kpọrọ "Global Coalition for Security & Democracy in Nigeria" na-ekwu okwu ime taa na gburugburu Naịjiria.

O kwuru sị na ndị na-akpọ oku ngagharịiwe a pụta gosi onwe ha.

A tọrọla Igwe n'Enugwu steeti,

Image copyright Nwafor Chiedozie
Nkenke aha onyonyo Igwe Sunday Orji na Nwunye ya

Ndị ntọ amaburula igwe ndị Obom Agbogugu dị n'obodo Awgụ, n'Enugwu steeti.

Dịka Ebere Amaraizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, a tọrọla ya na nwunye ya n'ụzọ Ogbaku dị n'ụzọ e si esi Enugwu aga Pọtakọt.

N'ofesi, Connor Betts egbuola nwanne ya

Image copyright CBS News

Dịka a na-eru uju ebe oji egbe gbagburu mmadụ itoolu n'ụlọahịa dị na Dayton, Ohio dị na mba Amerịka, a chọpụtala na nwanne ya nwaanyị so na ndị ọ gbagburu.

Ndị uweojii obodo Dayton kwuru na Connor Betts dị afọ 24, ji naanị ntabianya 30 gbuo mmadụ ole ahụ ma merụọ ihe ruru mmadụ 27 ahụ n'ụlọ nkwari ọ gara.

Ndị uweojii kwuru sị na ọ bụrụ na ọ hụrụ ụzọ baa n'ime ebe ahụ, na ndị mmadụ gaara agwụ.

N'akụkọ yiri ya,

Ndị Amerịka kwuru na ha na-enyocha okwu gbasara mwakpo onye oji egbe gbagburu mmadụ iri abụọ n'El Paso, Texas, dịka okwu oyiegwu.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Ọ kwaala ndị na-akwado Manchester United dịka ndị otu ha sepụrụ aka n'ihe gbasara ịzụta Pablo Dybala.

Ha na Juventus bụ ebe Dybala na-agba, kwụsịrị ịkpa ka ha kwuru na ha agaghị akwụnwu ego ole ha chọrọ.

Mana dịka okwu Dybala na-amịtaghị mkpụrụ, Harry Maguire ebinyela aka n'akwụkwọ isonyere ndị Man Utd.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Harry Maguire abụrụla onye Man Utd.

Ihe ruru nde paund iri asatọ ka ndị Man Utd mefuru iji hụ na ha zụtara Maguire bụ onye na-agbaburu otu Leicester City.

Nke a bụ egọ kachasịnụ a na-akwụ n'isi onye na-agba azụ (defender) kamgbe egwuregwu bọọlụ bidoro.

Akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ