Toni Morrison: Ihe isii ị maghị maka nwaanyị a riterela nturuugo 'Nobel' maka edemede ya

Akụkọ ndị dị mkpa taa bụ Tuzde (6/8/2019)

Toni Morrison alaala mmuo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akwụkwọ akụkọ Morrison dere gunyere 'The Bluest Eye', 'Beloved', 'Paradise' na 'Love'

Toni Morrison, nwaanyị mba Amerịka a ma ama maka irite nzere 'Nobel Prize' n'ihi akwụkwọ o dere anwụọla ka ọ gbachara afọ 88.

Morrison nwụrụ ka ọ rịchara ọrịa nwa oge dịka ndị ezinụlọ ya si kwuo.

Ihe isii ị maghị maka Toni Morrison

1. Nwaanyị nne na nna ya abụghị ọgaranya mana ha gbara mbọ ziga ya ụlọakwụkwọ mahadum ebe ọ gụrụ maka asụsụ Bekee bụ onye na-ede akwụkwọ e jiri ide maka ịgba oke agbụrụ mara.

2. O dere akwụkwụọ agụmagụ ruru 11 ndị gụnyere 'Beloved', 'Paradise 'Love ' nakwa 'The Bluest Eye' nke bụ akwụkwọ mbụ o dere n'afọ 1970.

3. Akwụkwọ ya bụ "Beloved" bụ akụkọ maka nwata nwaanyị ohu gbara ọsọ, nke mechara bụrụ ihe e tinyere n'ihe onyonyo nke agbara nwaanyị a ma ama bụ Oprah Winfrey soro mee.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Obama tunyere ya nzere 'Presidential Medal of Freedom'

4. 'Beloved ritekwara Morrison nzere 'Pultizer.'

5 N'afọ 1993, e tunyere Morrison ugo nke 'Nobel Prize for Literature' nke mere ya nwaanyị isiojii mbụ ga-enweta nturuugo ahụ.

6. Nzere ndị ọzọ Morrison ritere gụnyere ;'Légion d'Honneur' nakwa 'Presidential Medal of Freedom' nke ọbama tunyere ya n'afọ 2012.

EFFC ekechiela akpaego Legọs steeti dị n'ụlọakụ atọ

Image copyright @AkinwunmiAmbode
Nkenke aha onyonyo AkinwunmiAmbode bụ aka chịburu Legọs steeti

Ụlọikpe ukwu dị n'Ikoyi Legọs nọrọ ụbọchị Tuzde nye iwu ka a kpachie akpaego atọ nke bụ nke Legọs steeti maka mmefu ego ruru ijeri naira itoolu na ụma (N9.9billion).

Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka a kpọrọ EFCC n'aha ịchafụ kpara akwụkwọ were rịọ ikike ijichi akpaego ndị ahụ nke odeakwụkwọ Akinwunmi Ambode oge ọ bụ aka na-achị Legọs steeti bụ Adewale Adesanya ma maka ya.

EFCC ndị gbara ama n'akara Facebook nakwa Instagram ha na-ebu ebubo na ego karịị ijeri naira itoolu sị n'akpa Legọs steeti banye n'akpaego dị n'ụlọakụ atọ( anyị achọghị ịkpọ aha ha) n'oge ọchịchị Ambode nke Adesanya na ndị ọzọ ga na-adobiri.

Emume Sala eruola

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Eid el Kabir bụ emume ndị ụka Alakụba ji Ebule eme.

Gọọmentị etiti ekwuputala na ụbọchị Monde nakwa Tuuzde, abalị iri na abụọ na abalị iri na atọ nke ọnwa Ọgọst, ga-abụ ụbọchị ezumike ọha obodo.

Nke a bụ iji sonyere ndị okpukpere alakụba na mmemme "Eid el Kabir" nke afọ a.

Onyeisi ngalaba mgbasaozi na mịnịstrị 'internal affairs' bụ Mohammed Manga, kwuputara nke a n'akwukwọ akụkọ o zipụrụ na mgbede taa bụ Tuuzde.

Wayne Rooney alọghachila England

Image copyright Rex Features

N'egwuregwu, onye bọọlụ a ma ama bụ Wayne Rooney ahapụla otu egwuregwu bọọlụ DC United nke mba Amerịka laghachi England wee sonyere ndị otu Derby County.

Rooney ga-arụ ọrụ na Derby County dịka ọgbaa bọọlụ nakwa onye nkuzi bọọlụ iji were na-akwado maka ibido ndụ dịka onye nkụzi bọọlụ mgbe ọ ga-akwụsị ịgba agba.

Unu emeela n'ịgbajọ 'RevolutionNow' - Onyeisiala Buhari

Image copyright @Mbuhari

Ụlọọrụ onyeisiala ekeleela ndị Naịjirịa maka apụtaghị ịbịa soro mee ngagharịiwe 'Revolution Now' ụbọchị Ọgọst 5,2019 dịka ọtụtụ ndị gawara mkpa dịịrị ya.

Onye enyemaka onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu kwuru na nke a bụ mmeri nye ọchịchị onye-kwuo-uche-ya.

N'okwu ya, "Taa ọtụtụ ndị Naịjirịa gawara mkpa dịịrị ha; ọrụ, ụlọakwụkwọ na ilekọta ezinaụlọ ha, site n'ime nke a ha chekwara ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke Naịjirịa tara ahụhụ nwete."

Shehu gara n'ihu kwuo na ndị so mee ngagharịiwe a mere ya maka ọchịchọ nke onwe ha.

Enugwu Steeti ga-ehiwe ndị nchekwa oke ọhịa

Image copyright Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ha ga-ehiwe ndị nchekwa oke ọhịa dị mmadụ otu puku na narị asaa n'ime otu ọnwa iji kee nkwụcha n'ihe banyere nchekwa.

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kwuru nke a na nzuko ya na ndị nchekwa ime obodo nwere n'ụbọchị Mọnde.

N'Ofesi

Image copyright Reuters

Ụlọọrụ akụnaụba nke mba Amerịka a kpọọla mba Chaịna ndị mwụgharị ego dịka ọnụ ego Yuan nke Chaịna dara na ntụnyere dọla nke Amerịka

Okwu a nwere ike ibute obimgbalielu n'azụmaahịa dị n'etiti mba abụọ ndị a.

N'egwuregwu

Image copyright Heartland FC

Onye bụbu onye nchịkọta otu egwuregwu Mountain of Fire bụ Fidelis Ilechukwu etinyela aka n'akwụkwọ ịchịkọta ndị Heartland nke Owere rue afọ atọ.

Ilechukwu bụ onye a na-akpọ 'the working one' na-agba mbọ ịchọpụta ụmụaka nwere onyinye ịgba bọọlụ na Naịjirịa. .

Nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ