Bank robbery: Ndị ojiegbeezu awakpoola ụlọakụ n'ehihie na abọ mụ anya

Broad Street Image copyright Getty Images

Ndi uweojii Ondo steeti ekwuola na ha kụrụ ndị ojiegbeezu wakporo otu ụlọakụ dị n'Iju n' okpuru ọchịchị Akure-North n'Ondo steeti n'ehihie Tuzde njọ ahịa dịka o nweghị ihe ha zutere.

Mana ndị omekome ahụ gburu otu onye ọrụ ụlọakụ ahụ, ebe ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara ka ndị ekperima ahụ wụchiri ụlọakụ ahụ wụwa mgbọ n'ehihie na abọ mụ anya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC Igbo na "o nweghị ihe ha zutere."

O kwuru na ndị ọrụ ha nwetara ozi na ndị omekome zọchiri n'ụlọakụ ahụ, ma zaa oku a kpọrọ ha ngwangwa.

Joseph, onye gbara ama na mkpọ tụrụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ oge ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ kwuru na ndị ekpereima ahụ ghaara ụgbọala abụọ ha jiri bịa ije ọjọọ ahụ, gbalaga.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ngagharịiwe ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere maka ụgwọ e ji ha

Ọ gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-esi imi n'ala inweta ndị nyụrụ ihe na-esi ebe ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium

Isiokwu Ndị Emetụtara