Catholic Priests Protest: 'Jogging' ka ndị ụkọchukwu mere n'Enugu - Mbaka

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị na-ede akụkọ ụgha gbasara m ga-edeta abụmọnụ - Mbaka

Fada Ejike Mbaka agọrọla ụkwụ na aka na o soghị mee ngagharịiwe ndị fada ụka Katọlik mere n'Enugwu n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019.

N'okwu o kwuru ka ọ na-ezisa oziọma n'ụlọụka ya, o kwuru sị na ndị fada mere ngagharịiwe maka ọnwụ Paul Offu, kpara agwa ụmụaka.

Mbaka bụ ụkọchukwu a ma ama na-elekọta Adoration Ministries Enugwu kwuru sị na ndị fada ibe ya emeghi ihe kwesịrị ekwesị.

Ọ kọwara na ọ gwara ndị fada ibe ya ka ha chere ka gọvanọ nnyochaa ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghụrụ, mana ha egeghị ya ntị mapụ n'ezi malite ime ngagharịiwe.

O kwuru sị na akụkọ na-foto na-efegharị na o so ndị fada ibe ya mee ya bụ ngagharịiwe, bụ okpotokpo asị n'ihi na ọ nọ n'Abuja mgbe e mere ihe ahụ.

Nkenke aha onyonyo Ndị fada mere ngagharịiwe maka ogbugbu fada Offu

O kwuru na ọ bụ Fada Valentine Ubaene yiri ya nọ na foto ahụ, na ọ bụghị ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-ede akụkọ ụgha a na-edetere onwe ha abụmọnụ makana ha na-edegide "onye e tere mmanụ nsọ".

O kwuru na ekpere ya bụ na a ga-achọpụta ndị gburu fada ahụ ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịkpọzị ndị Fulani ọchịehi aha, ganye na gọọmentị achọpụtala n'ezie na ọbụ ha gbagburu Fada Paul Offu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe

Cheta na ndị ụkọchukwu karịrị otu puku gagharịrị Enugwu niile ma gakwaa n'obi gọọmentị iji gosi iwe dị ha n'obi maka ogbugbu ndị omekome gburu Paul Offu nakwa Fada Clement Ugwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a