Uche Ogbodo: Arahụrụ m n'okpuru 'step' mgbe m malitere ime ihe nkiri

Uche Ogbodo bịara BBC Igbo maka emume 'Ginị na-Afịọ' were kọwa ọtụtụ ihe banyere ya, ọkachasị etu o si malite ime ihe nkiri Nollywood.

Nwaada Ogbodo si na ya tara ezigbote afụfụ mgbe ya malitere, mana dịka onye chi ya nyere akaraka ime ihe nkiri, onwetere ohere igosi onwe ya.

"Ọkwa otu puku naira ka a na-akwụ anyị ụfọdụ mgbe, ụfọdụ oge, agaghịdị akwụ. Mana, uche dị n'ihe m na-eme."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ na-adị agbagwoju ya anya ma ụmụagbọghọ na-amalite ime ihe nkiri na-akọ maka ndị na-asi ha ka edina ha tupu enye ha ohere isonye n'ihe nkiri.

Ogbodo tinyekwara ọnụ n'usoro eji enye nwata ara dịka a na-apakọ izu inye nwa ara (Ọgọst 1-7) nke Bekee kpọrọ "World Breast Feeding Week".

Nwaada Ogbodo sị na ọ bụ ihe ọma nwata ịṅụ ara ọfụma ma ya bụrụ na nne mụrụ ya ga-emenwu ya.

O kwuru nna ya nyere nwa ya ara n'agbanyeghị egwu ọtụtụ ụmụnwaanyị na-atụ na inye nwa ara ga-eme ka ara ha daa n'ihi uru dị na ya.

Mana o kwuru na ya enyeghị nwa ya ara n'usoro Bekee kpọrọ 'exclusive breastfeeding' maka ọrụ ya enyeghị ya ohere ime etu a.

Ihe ndị ọzọ Ogbodo tinyere ọnụ na ya bụ etu ụmụnwaanyị ga-esi na agbanarụ mwakpo maọbụ ime ihe ha achọghị ime na ngalaba Nollywood.

"Enyeghị m ohere ka ihe ọbụla dakwasị m. Ọ bụ igosi onwe m n'atụmatụ "auditioning" ka m jiri enweta ohere niile m nwetara ime ihe nkiri dị iche iche."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro

"Ọ bụ puku naira ka a na-akwụ m mgbe ahụ. Ufọdụ oge, agaghị akwụ m ihe ọbụla."

Isiokwu Ndị Emetụtara