Benin Market Fire: 'Ọkụ gbapịara ahịa mgbuka n'Uwelu, Benin metụtara ewu na ọkụkọ'

Akụkọ dị mkpa:

Ebonyi steeti na Naịjirịa Image copyright Getty Images

Mkpu akwa hịọrọ n'elu n'ala mgbe ọkụ gbapịara ụlọahịa mgbuka dị n'Uwelu Benin, Edo Steeti.

Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ malịtere n'ime abalị nke mere na o nweghị ngwaahịa ndị mmadụ azọpụtanwuru.

Otu onye na-azụ ahịa ebe ahụ aha ya bụ Joe gwara BBC Igbo na ọbụghị ahịa niile ka ọkụ ahụ gbara.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤlọahịa mmadụ 68 lara n'iyi n'ahịa dị n'Obiagụ n'Enugwu

Ọ kwuru sị: "Ebe ọkụ a gbara bụ na A na kwa B 'line', ebe a na-ere akụrụngwa Mercedes, Mazda nakwa Ford'.

"Ihe ruru ọdụ ahịa iri atọ gbapịara n'ọkụ ahụ.

"O metụtara ọtụtụ ndị Bini, ndị Agbor nakwa ndị Igbo."

Joe kwukwara na osote onyeisi okpuruọchịchị ebe ahịa ahụ dị bịara n'ụtụtụ iji were ya hụ ebelebe gburunu.

"Mana ka ọ dị ugbua, onwebeghi ihe ọbụla anyị nụrụ n'ọnụ ndị gọọmentị.

Police-tout class: Otu onye anwụọla, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ

Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii

Nghotahie dapụtara n'etiti ndị agboro na ndị uweojii edulala otu onye mụọ, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ, dịka ndị uweojii Anambara steeti siri kwuo.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed wepụtara ụbọchị Tuzde, o boro ebubo na ndị agboro chọrọ ịnapụ ndị uweojii bịara nnyocha maka ndị ojiegbeezu gbara ọsọ na-ezo n'ọdọụgbọala dị n'okporoụzọ Owere Road, dị n' Ọnịcha.

Ọgbaghara nke butere kpachikpachi okporoụzọ mere ka otu onye uweojii gbaa egbe nke tụrụ otu onye.

" E bugara ya ụlọọgwụ a kpọrọ 'Toronto' ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla."

Mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ ma na-anata nleta n'ụlọ 'Multichoice dịkwa n'Ọnịcha.

Joe Igbokwe e sorola n'ihe a na-eme

Nkenke aha onyonyo Joe Igbokwe

Nwa afọ Igbo bụ Joe Igbokwe ga-esonye na ndị ọnụ n'eru n'okwu na Legọs Steetị dịka aha ya so n'otu n'ime ndị kọmishọna iri na atọ nke Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu zịgara ụlọomeiwu steeti dịka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ.

Tupu a họpụta ya dịka kọmịshọna, Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs nakwa onyeisi 'Wharf Landing Fees Collecting Authority'.

Mana a matabeghi ngalaba gọọmentị bụ nke a ga-enye ya ka o lekọtawa.

Nke a bụ nke abụọ onye Igbo na-arụ dịka kọmịshọna na Legos.

Ben Akabueze rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna 'Economic Planning and Budget' agba abụọ bido n'afọ 2007 n'oge ọchịchị Babatunde Fashola dịka gọvanọ Legọs.

Nwoke isi nkụka na Sydney

Image copyright AYA YAMADA
Nkenke aha onyonyo Foto a gosiri ebe nwoke ahụ ji mma n'aka.

N'ofesi, ndị uweojii nke mba Australia ekwuola na otu nwoke ji mma merụọ otu nwata nwanyị ahụ n'obodo Sydney nwetụrụ ọrịa isi.

A na-arọkwa anya na ọbụ nwata nwoke ahụ sụgbukwara nwanyị ọzọ bụ onye e butere ozu ya n'okirikiri ahụ.

Ọbụ ụmụokorobịa atọ aha ha bụ Lee Cuthbert, Paul O'Shaughnessy nakwa Luke O'Shaughnessy gbalịrị jituo nwoke ahụ tupu ndị ọrụ nchekwa abịaruo kpụrụ ya.

Sneijder efeela aka

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Wesley Sneijder

N'egwuregwu ọgbaa bọọlụ onye mba Netherlands aha ya bụ Wesley Sneijder awụsala ọwa.

Sneijder gbara bọọlụ ihe ruru afo iri na asaa ma nwetakwa nturuugo di icheiche nke gunyere iko Champions league, Serie A nakwa Coppa Italia.

Ọ gbara bọọlụ n'otu egwuregwu ndị dịka Ajax Amsterdam, Manchester United, Real Madrid, Inter Milan nakwa Galatasaray.

Ọgwụ Ebola na-arụ ọrụ

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọrịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ 1,800 na mba DR Congo

N'oge na-adịghị anya, ọrịa ebola nwereike inwe mgbochi na ọgwụgwọ dịka ọgwụ abụọ ndị e nyochara gosiri nke a.

N'ime ọgwụ anọ e nyere ndị bu ọrịa na mba Congo DR ebe ọrị a na-akpa ike, abụọ n'ime ha kparaike n'ịgwọ ọrị a.

Ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka ọgwụ mgbochi ọrịa so mee nyocha ahụ sị na mpụtara nke a bụ "ezigbo akụkọ" n'ibu agha megide ọrịa Ebola.

Ọgwụ ndị a bụ REGN-EB3 na mAb114 na-eji akụrụngwa dị mmadụ na-ahụ ebuso ọrịa Ebola agha ma kpagbuo ike ya.

Ha kpara ike ruru pasentị iri itoolu (90%) n'ịgwọ ọrịa Ebola na nyocha ahụ e mere.

Ọ bụ unu ji gọọmentị akwụla ụgwọ opekatampe ọhụrụ

Image copyright AFP

Gọọmentị etiti ebola otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa ebubo na ọ bụ n'ihi oke ọchịchọ ha mere a malitabeghi kwụwa ha ụgwọ ọpekatampe puku naịra iri atọ.

Onyeisioche ụlọorụ na-ahụ maka ụgwọ ọnwa bụ Richard Egbule rịọrọ ndị ọrụ ka ha biko wedata aka na gọọmentị agbalịala site na nkwenye ibuli ụgwọ ọnwa ha.

Ndị Naịjirịa nwụrụ n'emume Hajj 2019

Image copyright Getty Images

Ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa nwrụrụla ugbua na Saudi Arabia n'ihi emume Hajj nke 2019 e ruola itoolu.

Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka Hajj bụ Ibrahim Kana gwara ndị ntaakụkọ nke a

N'egwurgwu

Image copyright Getty Images

One na-agbara Naịjirịa bọọlụ bụ Henry Onyekuru ahapụla otu Everton nke mba Ịngland gawa mba Fransị ịgbara ndị Monaco bọọlụ

N'aka ọzọ Michael Emenalo ahapụla ọrụ ya dịka onye ntuziaka egwuregwu bọọlụ na Monaco dịka ọ rụchara ọrụ afọ abụọ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla