Enugu meat suspension: Ndị na-ere azụ na-achị ka ọdọ anụ Enugwu tọgbọ chakoo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMiyetti Allah: Ahịa a gbachiri sụrụ m ụsụ

Iji rube isi n'iwu ndị Miyetti Allah tinyere, o nweghị ebe e gburu anụ ma ọ bụ ree anụ n'ahịa niile dị n'Enugwu steeti taa ụbọchị 14 Ọgọst, 2019.

Mgbe BBC rutere n'ahịa 'Old Artisan' na New Haven, Enugwu, ọdụ ebe a na-egbu ma na-ere anụ anụ tọgbọọ chakoo.

Ọtụtụ ndị na-ere anụ nọ n'ọdụ ahịa ha ma ha anaghị ere ihe ọbụla.

Ha kwupụtara obi ha na mgbachi a gbachiri ọdụ ahịa ha na etu o si metụta ha.

Ha kwuru na agbanyeghị na o metụtara azụmaahịa ha kama na ọ bụ ihe banyere nchekwa ndụ na akụnaụba n'Enugwu Steeti.

Benjamin Nnamani bụ onyeisi ndị na-egbu anụ kwuru na ha kwadoro nzuko gọọmentị na ndị Miyetti Allah bụ nke mere e ji gbachie ahịa ha.

Otu nwaanyị bụ Oriakụ Ude bịara ịzụ anụ kwuru na obi adịghị ya mma na ọ hụghị anụ ọ ga-azụ.

Cheta na ndị isi ahịa n'Enugwu esorola nzọmụkwụ otu Miyetti Allah n'ịmachi ogbugbu anụ ọbụla n'abalị abụọ.

Abalị abụọ ahụ bụ ụbọchị 14 na 15 n'ọnwa ọgọst ebe ndị Miyetti Allah manyere ndị otu ha ọzụzụ nchekwa.

N'ime akwụkwọ ozi nke BBC bitere aka, ndị isi ahịa machiri "ogbugbu na ọzụzụ anụ ehi ọbụla"

"Anyị na-agwa ndị otu anyị na a ga-agbachi ụlọ anụ onye ọbụla dara iwu a ebighebi" ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

Akụkọ ga-amasị gị: