Taraba police killing: Onye uweojii bụrụ gọọmentị ọnụ abanyela ofe dị ọkụ

Sunday U Japhet Image copyright Facebook/Sunday U Japhet

Ndị uweojii Naịjirịa sị na ha amalitela iime nchọpụta maka onye otu ha gwakasịrị gọọmentị Naịjirịa ahụ na Facebook

Onye uweojii ahụ kwukwara na ya ga-emegwara ogbugbu ndị agha gburu ndị otu ha atọ na Taraba.

Ọ bụ ndị uweojii na Steeti Yobe nwụchịrị nwaamadị a aha ya bụ Sunday Japhet ka odechara ọtụtụ ihe na akara Facebook ya.

Onyeisi ndi uweojii na Steeti Yobe bụ, Sunmonu Abdulmaliki gwara BBC Pidgin na ọ bụghị sọsọ gọọmentị ka nwoke a bụru ọnụ na ọkatọkwara ndị ọzọ.

"Ọbụghị sọ aha onyeisiala ka ọ kpọrọ, ọ kpọrọ osote onyeisiala, ndị omeiwu na onyeisi ndị uweojii. Anyị chọrọ ịmata ebumnuche ya."

"Ọ bụ ụlọọrụ AIG na zone 12 dị na Bauchi ka ọ nọ, makana ọ bụ ebe a ga-anọ nyocha ya ọfụma. Yobe nọ n'okpuru zone 12."

N'izuụka gara aga, ndị agha mere mmehe gbagbuo ndị uweojii atọ na Steeti Taraba.

Mgbe BBC Pidgin nwetere onyeisi Zone 12, bụ Basen Dapiya Gwana, ọ sị na onye uweojii a ekwesịghị ide ihe o dere na Facebook nke mere ọ ga-eji zaa ọnụ ya maka nke ahu.

"Anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe anyị, ebe ndị ọkaiwu anyị ga-ama ihe a ga-eme ya."

Onyeisi Gwana ekweghị ikwu ihe ha ji ama onye otu ha ikpe.

Sunday Japhet gbara avụvụ na Facebook maka o sị na-eji ya ụgwọ ọnwa nakwa ogbugbu ndị agha gburu ndị otu ha na Taraba.

O gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghi ezigbote ihe na ndi ụkọchukwu nke ofufe Kraịst na Alakuba adịghị ekwu okwu maka ihe ndi ọ sị na-eme maka ụjọ na-atụ ha.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a