Herdsmen Crisis: Anyị achọghịzị Fulanị ọchịehi na Mmaku - Ụmụokoroọbịa

Ụmụ Ikorobia Mmaku na-eme ngaghari iwe ugbua
Nkọwa foto,

Obi adịghị ụmụokorobia Mmaku na-eme ngagharịiwe maka nọgbụgbụ mmadụ ha na-ebo ndị Fulani ọchịehi

Ụmụokorobia Agboneri Mmaku n'Enugwu steeti mere ngagharịiwe na mgbede Tọzde rute okporoụzọ awarawa si Enugwu gawa Pọtakọt.

Ha sị n'iwe ha bụ maka ogbugbu mmadụ ha sịrị na ndị Fulani ọchịehi na-egbu n'obodo Mmaku nakwa okpuruọchịchị Awgu.

BBC Igbo rutere n'ụzọ Agboneri Mmaku, ma hụrụ ụmụokoroọbịa karịrị otu narị ndị ji mma, osisi na anyike.

Ha wee na-ekwupụta na oge eruola mgbe ha ga-achụpụ ndị Fulani niile na-achị ehi n'ebe ha.

Ha ṅụrụ iyi na ha ga-emegwara ndị fụlani ọchịehi arụ niile ha kpara n'obodo ha ma ọ bụrụ na ha apụghị n'obodo ha.

Kanu Nwankwo abụrụla onye ọrụ n'Imo Steeti

Ebe foto si, Imo State Youths

Onye a ma ama n'ịgba bọọọlụ na Naịjirịa bụ Kanu Nwankwo anarala ọkwa dịka onye enyemaka pụrụiche n'egwuregwu nke Imo Steeti.

Ọ gwara BBC na Tọzde na Gọvanọ Imo Steeti bụ Emeka Ihedioha nyere ọkwa a dịka onye enyemaka pụrụiche.

Aha onyonyo,

Kanu Nwakwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m

Onye enyemaka Ihedioha na mgbasa ozi bụ Izuchukwu Akwarandu n'ozi o wepụtara kwuru Nwankwo bịara iketa gọvanọ mgbe e nyere ya ọkwa a.

Ihe mberede ụgbọelu na Rọshịa

Ebe foto si, Reuters

Ihe ruru mmadụ iri asaa na anọ merụrụ ahụ dịka otu ụgbọelu mba Rọshịa fedara n'ike mgbe o zutere ọtụtụ ụmụ nnụnụ n'elu.

Ọtụtụ ndị sị na ọ bụ ihe ịrịbaama etu ụgbọelu a si fetuo n'akpọkasịghị.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị: