Port Harcourt Murder: Egwu ejidela ndị mmadụ maka nwaagbọghọ ọzọ a tọgburu

Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ
Nkenke aha onyonyo Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ

Egwu jizi ndị mmadụ na Pọtakọt n'ihi ozu nwaagbọghọ ọzọ e butere n'otu ụlọ oriri na nkwari n'mpaghara Woji nke dị na ogige G.R.A n'obodo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivas steeti bụ Nnamdi Omoni gwara BBC Igbo na ihe ahụ gbara ha gharịị mana ha ga-achọpụtarịrị onye kpara arụ ahụ.

Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-ebute ozu nwaagbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Pọtakọt.

Chetakwa na ụdị ihe a emekwaala na Owere, Sapele nakwa Legọs na nsonso a.

Omoni kwuru sị: "Anyi na-eleba anya ka anyị mata ihe kpatara ogbugbu ndịa nakwa onye maọbụ ndị aka ha dị na ya.

"Anyị agbaala ọtụ ndị ajụjụ ọnụ, ihe ha gwara anyị na-enyere anyị aka na nnyocha anyị na-eme."

O kwukwara na ndị uweojii na ndị nwere ụlọ oriri na nkwari ga-enwe nzukọ iji kpaa otu a ga-esi gbochie ihe dị otu a n'ọdịnihu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionElisabeth Ndubuisi Chukwu: "Gọọmenti South Afirika gbachiri nkiti maka ọnwụ nwanne anyị"

"Anyị ga amanye ndị niile nwere ụlọ oriri na nkwari ka ha tinye igwe onyonyo (CCTV) n'ụlọ oriri ha.

"Nke a ga-enyere ndị uweojii aka ịmata onye ọbụla batara n'ụlọ oriri ahụ."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ