Arsenal vs Burnley: Chi Arsenal abụrụla Burnley agada gbachiri ụzọ

Aubameyang celebrates Image copyright PA Media

Arsenal ewerela Burnley rachaa pịọm dịka goolu Alexander Lacazette na Pierre-Emerick Aubameyang nyere ha ohere imeri asọmpị nke abụọ ha na Premiere League nke 2019.

Burnley gbalịrị ịma ma ha a ga-enweta akara ọbụla na asọmpi a mana chi Arsenal ekweghi ha gafee.

Lacazette nyere goolu nke mbu na nkeji iri na atọ ebe Ashley Barnes sara ya na nkeji iri anọ na atọ.

Mana Aubameyang nyere goolu nke abụọ na nkeji iri isii na anọ iji nye Arsenal mmeri.

Image copyright Getty Images

Nicolas Pepe bu onye Arsenal ji nde dọla £72 zụta esoghi bido asọmpị a mana Dani Ceballos bụ onye si Real Madrid bịa so malite.

David Luiz sokwa gbaa bọọlụ nke taa. Nke a bụ asọmpi izizi ya kamgbe o si Chelsea gaa Arsenal.

Cheta na Arsenal meriri asọmpi izizi ha mgbe ha zutere Newcastle n'izuụka gara aga, were otu ọkpụ goolu dulaa ha.

Burnley nyekwara Southampton ọkpụ goolu atọ asataghị asata n'izu gara aga.

Arsenal bụzị ndị nke mbu ugbua na tebulu EPL, mana nke ahụ agaghị adigide.

Liverpool ga-ezute Southampton n'elekere atọ taa, ebe Manchester City na Tottenham ga-achịpụ ya n'elekere ise.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ

Isiokwu Ndị Emetụtara