Ike Ekweremadu atụọla ụkwụ na Naịjirịa

Ekweremadu Image copyright Getty Images

Sịnetọ Ike Ekweremadu alọtala na Naịjirịa ka ndị Ipob wakpochara ya n'obodo Jamini n'ụbọchị Satode n'ebe a na-eri ji.

Sịnetọ Ekweremadu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ụfọdụ ndị kpara ajọ agwa a.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya agbagharala ha.

Cheta na ọ bụ n'obodo Nuremberg ebe otu Ndi Igbo Germany na-eme emume iri iji ha nke a kpọrọ Ekweremadu oku dịka onyeisioche.

N'akụkọ yiri ibe ya,otu Ndị Igbo Jamini akatọọla agwa Ipob kpasịrị Sinetọ Ike Ekweremadu mgbe ọ bịara iri ji n'obodo Nuremberg ụbọchị Satọde

N'ozi si n'aka onyeisi ha bụ Ozofor Ogechukwu, ha rịọrọ Ike Ekweremadu mgbaghara ma kwuo na Ipob ga-atakụta ya aja maka ihe ha mere.

N'otu aka ahụ, ụlọ ọrụ na ahu maka mkpo Jamini na Naịjirịa ekwuola na ndị kpara mkpa mkpa ga-ezute iwu mba ahụ.

Nke a mere ka Ipob na ekwu na ha ka ga-eme ọzọ.

Ngagharịiwe 'RevolutionNow'

Otu kpọrọ onwe ha RevolutionNow emeela ngagharịiwe ọzọ na Legọs ka gọọmentị tọhapụ onyeisi ha bụ Omoyele Sowore

Cheta na anwụchiri Sowore n'izuụka ole na ole gara aga maka na ọ chọrọ ịhazi ngagharịiwe

N'ofesi

Image copyright AFP/Getty

Ụgbọelu agha mba Syria atụọla ogbunigwe n'ụgbọla agha ndị si mba Tọọkị aga obodo dị n'aka ndị ekweghịekwe Syria.

Ndị Tọọkị na-ekwu na mmadu atọ nwụrụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara.

Anyị ga-eme BBNaịjia nke anyị - Gọọmentị etiti

Image copyright Getty Images

Gọọmentị Naijirịa ga-amalite ime emume nkiri nke ha dịkwa ka Big Brother

Onye kwuru nke a bụ onyeisi ngalaba National Council of Arts and Culture bụ otunba Segun Runsewe.

Ọ sị na akwamiko a na-ame na emume Big Brother amasịghị omenala Naịjirịa nke mere ha ji ahazi nke ha ga-akwalite omenala.

Isiokwu Ndị Emetụtara