Ihe iri ị ga-eme iji chekwatụ ego gị maka ọdịnihu

Ndí mmadu na-anụ mmanya

Ndigbo na-ekwu n'okwu sị, "a na-eri akụ, akụ a na-abịa", na nke onye riri ka o bu ala, mana nke bụ eziokwu bụ na nwata na-ata akara na-ata ego ya.

Ọ dị mma mmadụ inweta onwe ya n'ihi na ogbu opi na-ehicha imi, mana onye ara kwesịrị iji uche ya.

Image copyright Chopilosbyslippery

Ọtụtụ ihe ị na-eme kwa ụbọchị, izu, maọbụ ọnwa iji nweta onwe gị nwere ike ịbawa gị ọgaraanya maọbụ gpapeere gị ụzọ ime ihe na-atụ n'anya ma ọ bụrụ ma ị tụlee ya.

Nkenke aha onyonyo Ihe dị ka achịcha Bekee a na-efe anụ na ihe ndị ọzọ nke a na-akpọ "Pizza", so n'ọkụ na-eri ego

BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ na-eso anyị na Facebook ajụjụ ihe ha na-atụnye ego iji mee onwe ha obiụtọ na ihe ọ na-eri ha n'izu.

Ọtụtụ kwuru na ihe na-amasị ha gụnyere ịṅụ manya 'beer', mmanya ọtọbịrịbịrị, nkwọbi, azụ ndụ amịrị amị, 'data' e ji aga n'ịntanetị nakwa ego e ji akpọ ekwentị.

Ndị ọzọ gụnyere mịchacha mịchacha jụrụ oyi (ice cream), 'pizza,' anụ ọkụkọ, abacha, ịgba chacha (sport betting) nakwa ịga sịnịma wdg.

Nkenke aha onyonyo Michacha michacha na-eri ụmụ ogoli ego

Ihe ndị ụmụnwoke kwuru gosiri na ọtụtụ n'ime ha na-etinye ego na nkwobi, mmanya na ihe oriri ndị ọzọ, ebe ụmụnwaanyị na-etinye ego n'akpụkpọụkwụ, akwa nakwa ịkpa isi.

Anyị gbakọrọ ihe mmadụ ole na ole n'ime ha na-atụnye n'ịtụ ndụ mmanụ n'otu izuụka inweta ihe ọ na-eri ha n'ọnwa, n'afọ nakwa ihe ọ ga-eri ha n'afọ iri.

Nkenke aha onyonyo Mịchacha mịchacha njụoyi nwere "grade" nke bụ na ị chọọ nke "ga-akpọfe gị", ị ga-akwụ ego gbalitere agbalite

Mazi Ezenwa Don kwuru na nkwọbi na ụgba na ihe ndị so ya na-efu ya puku naịra ise kwa izu.

Nke a pụtara puku naịra iri abụọ (N20,000) n'ọnwa, puku narị abụọ na puku iri anọ (N240,000) n'afọ nakwa nde naịra abụọ, puku narị anọ (N2,400,000) n'afọ iri.

Ezenwa mụbaa ego a ugboro abụọ, ọ ga-eji ya rụọ ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ ma ọ bụ anọ.

Lee etu ọ ga-esi mee nke a n'ime akụkọ a : I nwere ala? Lee ihe ọ ga-eri gị ịrụ ụlọ aka gị

Blessing Adannaya kwuru na "ana m eji ego m azụ data" ma kwukwa na ọ na-eri ya puku naịra atọ na narị ise (N3,500).

Image copyright Chopilos/Instagram
Nkenke aha onyonyo Anụ e ji ose na alibasa gwọọ na-atọwa ntị

Ihe nke a pụtara bụ na n'otu ọnwa, Adannaya na-atụnye puku iri na anọ (14,000) tụnye puku narị na puku iri isii na asatọ (N168,000) n'otu afọ, ebe ọ ga-eri ya otu nde naịra na puku narị isii na iri asatọ n'afọ iri.

Lee mgbakọ ihe itoolu ndị mmadụ na-atụnyekarị ego iji nweta onwe ha n'afọ:

Nkenke aha onyonyo Lee ihe a na-emefu n'ịtụ ndụ mmanụ n'afọ iri, ị mara na ị bụkwanụ ọgaranya zoro ezo

Lee ihe ndị mmadụ gwara anyị n'uju ebe a:

Ọtụtụ na-eche na ọ bụ naanị ọgaranya na-erifọ nke ọ ga-edowe echi.

Mana onye nhazi ego onye doro anya (personal finance expert) bụ Uche Iheanacho na-ekwu na 'ihe ọ masịrị gị na-enweta dịka onye na-arụ ọrụ maọbụ onye na-azụ ahịa, onye ọbụla nwere ike iwepụta ego ọ na-edokwa, opekatampe otu ụzọ n'ụzọ iri maka echi."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPersonal Finance: 'Uzọ ga-eme iji chekwatụ ego gị maka ọdịnihu'

I nwere ike ị na-achị ndị ọkpa akụ eri eri ọchị mana ị ma na o nwere ihe ị ga-amụta n'aka ha dịka o siri gbasa ichekwa ego gị, maka ebumnobi dị mkpa.

Lee ndụmọdụ ga-enyere gị aka maka ichekwat ego gị maka ọdịnihu:

1. Welata ego ị na-emefu n'oriri na ọṅụṅụ ma tinye ya n'ihe ga na-ewetara gị ego.

2. Zụọ ihe ụfọdụ ị chọrọ ịzụ oge o bere ego (promo, bonus, sales) ma tinye ego ahụ ị gaara emefu n'ụsọ maka nchekwa.

3. Zuo 'kolo' na-etinye ego kwa ụbọchị maọbụ izu. O ruo ọnwa atọ maọbụ isii were ego ị tụkọtara tinye n'ụlọakụ maka nchekwa.

4. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ bekee maọbụ i na-etinye ego i nwetara n'ụlọakụ, sonye n'atụmatụ ka a na-ewepụ ego n'akpaego gị maka nchekwa oge ọbụla ego batara ya.

5. Akpụkpọụkwụ nwere saịzị. Hapụ ile ndị ọzọ anya ka ị dị ka ha dị n'ihi na ị maghị ihe na-etiri onye egwu.

Ani dụrụ ọdụ, "Ọ bụghị ihe niile gbara n'ahịa ka ị ga-azụ."

"Kama ịzụ ekwentị iPhone 6, zụọ nke nwere ike ịrụkwara gị ọrụ ọ ga-arụ dịka Samsung."

Image copyright Luke Nwachukwu
Nkenke aha onyonyo Zụọ ihe ụfọdụ ị chọrọ ịzụ oge o bere ego (promo,bonus) maọbụ n'ahịa ebe o bere ego

6. Kama ịga 'jọint' ṅụọ mmanya, zụrụ mmanya ahụ laa, ṅụọ ya n'ụlọ gị.

7. Kama ịga n'ezi gaa ile 'Premier League', were mefuo oke ego ịzụrụ onwe gị na ndị enyi gị mmanya, zụọ 'subscription' lee bọọlụ n'ụlọ gị na-ezinaụlọ gị.

8. Tupu ị zụọ ihe, chee uru ọ ga-abara gị na ọghọm ọ ga-eweta tupu ị zụọ ya.

9. Jụọ onwe gị, ihe ahụ na-agụ gị, ọnwa ole ka ị ga-arụ ọrụ tupu i nweta ego ihe ahụ anya gị dị na ya?

10. Chọọ ahịa ebe a na-ere ihe ahụ ị chọrọ izụ ọnụ dị ala.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi

Isiokwu Ndị Emetụtara