Man United vs Crystal Palace: A nyakasịala Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ

Manchester United amaala afọ n'ala Image copyright Getty Images

Ndị Manchester United etiela 'ebe ooo' dịka Crystal Palace tiri ha ịkpa n'isi n'asọmpi Premier League.

Nke a malitere na nkeji 32 mgbe Jordan Ayew nwa Ghana nyeere ndị Crystal Palace goolu mbụ ha.

Man. United shiri ajọọ ọnwụ inyete goolu mana Crystal Palace kpọrọ ekwe nkụ rue n'ebe ngwụcha asọmpia ahụ.

N'ihi dịka nkeji 89 ka Man United nwetere goolu site n'aka Daniel James.

E cherekwara na egwu agwụla mana Crystal Palace tiri wụrụ Man United n'ala site n'inye goolu ọzọ si n'aka Patrick Van Aanholt na nkeji 90.

N'ikpeazụ Crystal Palace ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United n'ụlọ ha.

Chelsea na Norwich City:

Image copyright Getty Images

Otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha ga e buru ọkpa ekele nye Chineke maka ime ka ha nwete mmeri mbụ n'asọmpi Premier League nke afọ 2019/2020.

Chelsea nwetere mmeri a site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Norwich.

Goolu malitere izo ka mmiri na nkeji 3, mgbe Tammy Abraham nyeere ndị Chelsea goolu ha.

N'egbughi oge Norwich cheere Chelsea aka mgba site na goolu Todd Cantwell nyere na nkeji 6.

Mason Mount nke Chelsea gwara Norwich na mmadụ na-akarị ibe ya mgbe o nyere goolu na nkeji 17.

Image copyright Getty Images

Norwich gwakwara Chelsea na ha adịghị achị site n'imezu goolu ha abụọ abụọ na nkeji 31 tupu e gbuchie opi n'ọkara nke mbụ.

Dịka ọkara nke abụọ malitere, n'ime nkeji 68, Chelsea gosiri na ha nwere Abraham dịka nna mgbe Tammy Abraham nyere goolu nke abụọ ya n'asompi ahụ.

Nke a mere Chelsea ji were ọkpụ goolu atọ Norwich satara abụọ gbapee igodo ji ọnụ ụzọ mmeri ha n'asọmpi Premier League.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: