Enugu Kidnapping: O nweghi onye tọọrọ m kama a gara m n'ụlọ enyi m nwoke - Nwaada Anioma

Ebere Amaraizu

Ndị uweojii Enugwu anwụchiela otu nwata nwaanyị asị na a tọọrọ mana ọ bụrụ na ọ gara n'ụlọ enyi ya nwoke.

Nke a dị n'ime akụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Ebere Amaraizu zitere BBC Igbo.

Nwata a kpọrọ Kosisochukwu Anioma bụ nwa Frank Anioma onye bụbu onyeisioche okpuruọchịchị Nkanu East dị n'Enugwu Steeti sị na onweghi mgbe a tọọrọ ya.

Kama na ọ hapụrụ Enugwu n'ụtụtụ Tọzde abalị 22 Ọgọst, 2019 gawa n'Owere Imo Steeti ịhụ enyi ya nwoke bụ Oluehi Somtochukwu.

O kwuru na onweghi onye ọ gwara na n'ụlọ ha na ọ na-eme njem gawa Owere n'ụbọchị ahụ.

N'okwu ya 'Eji m aka m hapụ ụlọ anya dị n'Enugwu ma gawa Owere ịhụ enyi m nwoke, onweghi onye tọọrọ m, onwekwanụghị onye ga-atọọrọ m."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị afọ iri na atọ ma nọọrọ klaasị nke atọ n'ụlọakwụkwọ 'Command' Sekọndịrị dị n'Abakaliki Ebonyi Steeti.

Kosisochukwu kwuru na ya na enyi nwoke nọ n'otu klassị n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Cheta na akụkọ pụtara nke na-ekwu na nna ya sị na ndị omekaome tọọrọ ya n'ụbọchị abụọ gara aga.

Mgbachị Ihedioha nkịtị - Okorocha gwara Onyeisi ndị uweojii

Image copyright Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha
Nkenke aha onyonyo Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti

Aka chiburu Imo bụ Rochas Okorocha agwala onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ ghara itinye anya n'akwụkwọ mkpesa Gọvanọ Emeka Ihedioha dere banyere ya.

Site n'ọnụ onye enyemaka ya bụ Sam Onwuemeodo, Okorocha sị na mgbesa ndị ahụ eneghi ebe mbakwasị ụkwụ.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Honkong dịka ọ banuere ọgbaghara na mmerụ ahụ.

Mana ọfụdu n'ime ndị a na-eme ngagharịiwe nọ na-ama okwute nke butere ndị uweojii ji achụ ha.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu Crystal Palace ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu zọọl Manchester United aja n'ụlọ ha Old Trafford.

N'aka nke ọzọ Chelsea nwetere mmeri mbụ ha n'asọmpi Premier site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Norwich City.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla.