Igbo Marriage: Ihe mere ndị Igbo ji ajụ ajụjụ tupu alụmdi na nwunye

Paul Chukwu na nwunye ya

Alụmdi na nwunye bụ omenala na-ejikọta mmadụ abụọ na-amabughị onwe ha, nne na-ejighi, na-esighi n'otu agbụrụ maọbụ otu obodo ọnụ.

A na-ahụta alụmdi na nwunye dịka ihe kachasị mkpa na ndụ ndị Igbo, nke chere nwata nwoke na nwaanyị n'ihu ma ha tolite.

Alụmdi na nwunye bụ njem a na-abanye n'ime ya ma nọrọ rue oge ọnwụ, ọ bụghị njem agatụ a lawa azụ.

Nke a mere nwoke maọbụ nwaanyị ọbụla na-alụ di na nwunye kwesịrị ịsa anya na mmiri.

Otu ụzọ gbapụtara ihe ndị Igbo na-eji asa anya na mmiri tupu alụmdi na nwunye bụ ihe a kpọrọ "Ịjụ ajụjụ".

Gịnị mere eji ajụ ajụjụ?

Image copyright Teyannasecret/Instagram

Onye ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chiagozie Nnabuihe na-akụzi asụsụ Igbo na Mahadum Legọs kọwara ụfọdụ ihe mere ndị Igbo ji ajụ ajụjụ.

N'okwu ya "Onweghi nwoke maọbụ nwaanyị ga-achọ ka onye ọ lụrụ bụrụ mmekpa ahụ nye ya, nye ezinaụlọ ya nakwa aha ezinaụlọ ya, ọ bụ n'ihi nke a ka e ji na-ajụ ajụjụ."

Kedụ mgbe jụ ajụjụ malitere?

Ịjụ ajụjụ malitere mgbe alụmdinanwunye ndị Igbo malitere, ebe alụmdi na nwunye ndị Igbo malitere mgbe obibi ndụ ndị Igbo malitere.

Ya mere, onweghi onye ga-asị lee kpọmkwem mgbe o bidoro.

Kedụ ihe a na-ajụ n'ajụjụ?

Ọkammụta Nnabuihe gara n'ihu kọwaa na ihe ndị dị mkpa a na-ajụ n'ajụjụ gụnyere;

1. Onye bụ nne na nna ya na etu ha si ebi ndụ? N'ihi na a sị na ewu na-ata agbara nwa ya a na-ele ya anya n'ọnụ wee na-amụta, etu nne na nna si ebi ka a tụrụ anya na nwa ha ga-esi biri.

2. Onwere ọrịa ọjọọ dị n'ime ezinaụlọ onye ahụ si pụta ma ọ bụ nke ọ na-arịa? Ọrịa ndị dịka akwụkwụ na isi mgbaka dgz. E kwenyere na ọrịa ndị a nwereike isi n'aka feere nwa ha.

Image copyright BigHWedding/Instagram

3. Ha a na-ezu ohi? Igbo sị na ohi na-echu aha. E kwenyere na onye ohi ga-amụta onye ohi. Agbụrụ e ji izu ohi mara, ndị Igbo na-asọ ya asọ.

4. Ha a bụ ndị umengwụ? Igbo sị na onye umengwụ bụ onye arịrịọ, onye arịrịọ bụrụ onye ohi. Ya mere onweghi onye ga-achọ ka ya na agbụrụ ndị umengwụ nwee mmekọ.

5. Ihe ọzọ a na-ajụ bụ ma onye ahụ ọ bụ Diala, Osu, Ume, Ohu, Njoku, Mmajụ, Nwaatanị, Nnọmafọ. Otu ndị a niile na-asọ onwe ha asọ. Onweghi onye ga-achọ ịlụ ibe ya.

Ndị a na-ajụ ajụjụ a abụghị ezinaụlọ nke nwoke ma ọ bụ nwaanyị kama ọ bụ ndị agbata obi na ndị obodo maara ezinaụlọ ahụ nke ọma.

Usoro e ji ajụ ajụjụ

Image copyright ObinnaUdora/Instagram

Ịjụ ajụjụ bụ oke na ọrụ dịrị nke nwoke na ezinaụlọ ya nakwa nke nwaanyị na ezinaụlọ ya.

Ọ bụrụ na nwoke tozuo oke, kpata ego ma dị njikere ịlụ nwaanyị, ọ ga-agwa ndị ezinaụlọ ya, ndị enyi nakwa ikwu na ibe ya.

Ha ga-ajụ ya "O nweela nwaanyị ị hụtara?" ọ bụrụ na ọ hụla, ha ga-abanye n'ọhịa ajụjụ mana ọ bụrụ na ọ hụbeghi, a ga-achọrọ ya nwaanyị tupu ha abanye n'ọhịa ajụjụ.

Ọ bụrụ na afọ juru ha n'ihe ha chọpụtara banyere nke nwaanyị, ọ ga-akpọrọ ndị ụlọ ya gaa kụọ aka n'ezinaụlọ nke nwaanyị iji gosi mmasị ya.

Image copyright Nem_Photography/Instagram

Ezinaụlọ nke nwaanyị ga-asị ndị nke nwoke ka e nye ha oge ole na ole iji jụọ nwa ha nwaanyị ma uche ya ọ dị n'ịlụ nke nwoke.

Mana oge ahụ gụnyere nke ha ga-eji nyochaa ezinaụlọ nke nwoke site n'ijụ ajụjụ ndị dị mkpa.

Ọ bụrụ na ha mechaa nke a ma nwee mmasị ebe nwoke ahụ nọ, ha ga-ezi ezinaụlọ ya ozi iji malite njem alụmdi na nwunye ha.

Kedụ uru ịjụ ajụjụ bara.

Ọkammụta Nnabuihe sị na uru dị n'ijụ ajụjụ gụnyere;

  • Ọ na-enye aka ịgbanahụ ịkwa arịrị 'Ọ bụrụ na m maara' n'ime alụmdina nwunye.
  • Ọ na-enye aka ịgbanahụ ihe ga-ebute alụkwaghịm di na nwunye.
  • Ọ na-egbochi ihiwe agbụrụ ọjọọ n'ụwa.

N'ikpeazụ ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwaanyị gbasoo usoro ịjụ ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere ha aka ihiwe ezinaụlọ ga-adị rue mgbe ebighi ebi.

Ndị Igbo kwenyere na ọ bụ site n'alụmdi na nwunye ka eji ebi ndụ ebighi ebi, nke bụ onye a mụrụ ya mụta ibe ya.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ