Enugu state: Ndị omekome awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii n'Ikirike

Ebere Amarizu Image copyright Ebere Amarizu

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Ikirike dị n'Idaw-river, n'Enugwu steeti.

"Enweghi onye nwụrụ na ya bụ mwakpo, mana mmadụ abụọ maọbụ atọ merụrụ ahụ" dịka Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke steeti ahụ si kwuo.

Ndị uweojii kwuru na ihe a mere ebe elekere abụọ nke n'isi ụtụtụ, ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọstụ 2019.

Ndị omekome a bu mma na osisi, ji aghụghọ na ha bịara ime mkpesa bata n'ime ụlọorụ ndị uweojii ebe ha nọ kpaa mkpamkpa ha ma gbalaga.

Amarizu kwuru na ha atụọla imi n'ala iji chọpụta ndị omekome ahụ.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwakpo a ebe a:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Gọọmentị Enugu state sị anyị kpochapụ ebe ndị ntọrị na-ezo'

Isiokwu Ndị Emetụtara