US Visa Fee: Nigeria ebutuola ego ole ndị America ga na-akwụ maka 'visa'

Ụlọọrụ akwụkwọ njem ala Amerika

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Amerika were udi ụlọọrụ a n' Abuja na Lagos

Akụkọ si na mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo na-akọwa na ha ebutuola ego ole ndị mba Amerịka ga na-akwụ maka 'visa' tupu ha abata Naịjirịa.

Nke a na-abịa ka naanị otu ụbọchị ndị mba Amerịka buliri ụgwọ Naịjirịa ga na-akwụ maka inweta 'visa' nke ha, gachara.

Maka nke a, mịnịsta na-ahụ maka ngalaba ahụ bụ Rauf Aregbesola, nyere iwu ka e butuoruo ego ahụ dọla 150, malite n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst 2019 a.

Lee ihe ha dere na Twitter:

NEMA: Mmadụ 153 ka e si mba Libya Kpọlata

Ndị Naịjiria sị Libya lọta

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ otu nari iri ise na atọ ndị tọọrọ na mba Libya bụ ndị lọghachiri Naijiria ụbọchị Wenezde site n'ọdọ ụgbọelu Muritala Muhammed Airport dị na Legos.

Onye nọchitere onyeisi ndị ngalaba gbatagbata bụ National Emergency Management Agency bụ Slaku Lugard nabatara ndi a gụnyere ụmụnwanyị iri ise na itoolu, ụmụnwoke iri asaa na asatọ na ụmụaka iri na isii.

Ha bubu n'obi isi mba Libya gaa Yurop.

State emergency Management Agency nke Anambra Steeti amaala ọkwa nkwucha idemmiri

Idemmiri n'Ụmụọkpụ

Ebe foto si, Uchenna Madubo

Nkọwa foto,

Ndị niile bi na ikpere mmiri kwado ikwapụ maka idemmiri.

N'aka nke ọzọ, ngalaba anabatala nke Anambra steetị amaala ọkwa ka ndị obodo niile bi na ikpere mmiri kee nkwụcha ma kwadowa ịkwapụ maka idemmiri na-abịa.

Ọ bụ odee akwụkwọ SEMA bụ Paul Odenigbo kwuru nke a na ọgbakọ e nwere na Ụmụmbo dị na Ayamelu, Awka, Anambra steeti na nso nso.

N'Ofesi

Boris Johnson

Ebe foto si, AFP

Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth nke 11 enyela ntụziaka ka a kwụsịtụ ụlọọmeiwu mba ahụ ọrụ.

Ihe nke a pụtara bụ na ndị ụlọomeiwu mba ahụ agaghị enwe ike ịkpakọrịta maka mpụta mba Briten n'otu European Union na enweghị nkwekọrịta ọbụla n'abalị 31 nke ọnwa Oktoba.

N'Egwuregwu

Ndị na anọchite Naịjirịa na asọmpị 'African Games' nke 2019

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị na anọchite Naịjirịa na asọmpị 'African Games' nke 2019

Naịjirịa agbagotela n' ọkwa ihe nrite nke African Games were bụrụ onye nke anọ.

Naịjirịa ji ihe nrite iri ise na abụọ nke gunyere olaedo iri abụọ, ọla ọcha iri na isii na ọla nchala iri na isii.

RevolutionNow: Ụlọikpe jụrụ inye iwu ka a tọghapụ Sowore

Omoyele Sowore
Nkọwa foto,

Omoyele Sowore, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha otu AAC sọ n'isi sekpụ ntị ngagharịiwe #RevolutionNow

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nọrọ ụbọchị wednezde jụụ ikwenye arịrịọ nke Omoyele Sowore rịrọrọ ka a kagbue njichi ndị uweojii bụ DSS n'aha ịchafụ jichiri ya.

Ụlọikpe ọzọ dịkwa n'Abuja nọbụ n'abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst nye DSS ikike ijichi Sowore abalị 45, nke a mere dịka DSS rịọchara ka enye ha abalị 90 iji mee nke a.

Ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Jọstịs Evelyn Maha kwuru na ya enweghị ike iwezụga mkpebi nke ụlọikpe ọzọ nke nyeburu DSS ikike ijichi Sowore rue abalị 45 iji nye ha ohere inyocha ya maka ebubo iyi egwu.

Ọ gwara ha ha lọghachi n'ịụlọikpe ebe ndị DSS nwetara mkpebi ka ha lebanye anya n'okwu ahụ.

Cheta na ndị DSS nwụchiburu Sowore n'abali foro Ọgọst 5 bụ ụbọchị e hiwere ngaghariiwe RevolutionNow.

Ezughi m ego ndị Abia - OUK

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor kalu

Aka Chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu agọrọla ọnụ ya n'ụlọikpe n'ime ebubo izu ego dị ijeri naịra asaa na ụma nke ụlọọrụ mgbochi nrụrụaka bụ "Economic and Financial Crimes Commission" (EFCC) boro ya.

Kalu kwuru na Abia Steeti enweghi ụdị ego ahụ n'oge ọ nọ n'ọchịchị.

O kwuru nke a n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs ebe ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ ya na ụlọọrụ ya bụ Slok nakwa onye direktọ akụnaụba Abia Steeti n'oge ahụ bụ Jones Udeogu.

N'okwu ya "Abia Steeti enweghi ụdị ego ahụ, oge m na-apụ n'ọchịchị, anya gbaziri ego kụọ ụgwọ ọnwa.

"Ego a na-enye Abia Steeti kwa ọnwa mgbe m bara n'ọkwa n'ọnwa Juun 1999 bụ nde naịra 168."

Ikpe a dị n'etiti EFCC na Kalu a nọọla afọ iri na abụọ.

Gọọmentị etiti na ụlọọrụ P&ID

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-aga na mba Amerịka gbaghaa ikpe ụlọikpe dị na mba Briten kpere sị ka ọ kwụọ ụlọọrụ "Process and Industrial Developments" (P&ID) ego dị ijeri dọla itoolu na ọma

Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed kwuru na Naịjirịa agaghị atufu akụnaụba nye ụlọọrụ ahụ.

N'ofesi

Ogbunigwe mgbagbuonwe na Gaza

Ebe foto si, Reuters

Ndị ogbunigwe mgbagbuonwe e che na ha bụ ndị otu Islamic State wakporo ebe nnyocha ndị uweojii na Gaza dị na mba Palestine ma gbuo mmadụ atọ n'ime ha.

Otu n'ime ndị ogbunigwe mgbagbuonwe a nọbuuru n'aka ndị uweojii n'oge mbụ.

N'egwuregwu

Alexis Sanchez

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwuregwu Inter Milan ekwela ịgbaziri Alexis Sanchez site n'aka ndị Manchester United.

Onye nchịkọta Inter Milan bụ Antonio Conte chọrọ ime nke a tupu a pịachie akwụkwọ ịre na izụ ndị ọgba bọọlụ nke afọ a.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo,

Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka.