Parliament: Ihe ịkwụsị ụlọomeiwu mba Briten n'ike pụtara

Boris Johnson

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth nke abụọ, enyela ntụziaka ka a kwụsịtụ ụlọomeiwu mba ahụ ọrụ.

Nke a na-eme dịka Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kpọrọ Ezenwaanyị Elizabeth oku ka o mee nke a.

Ụlọomeiwu mba ahụ ga-akwụsị ọrụ abalị ole na ole ọ fọrọ tupu ndị omeiwu ebido ọrụ n'ọnwa Septemba.

Ihe nke a pụtara bụ na ndị ụlọomeiwu mba ahụ agaghị enwe ike ịkpakọrịta maka mpụta mba Briten n'otu European Union na enweghị nkwekọrịta ọbụla n'abalị 31 nke ọnwa Ọktoba.

Ọtụtụ ndị nwere agba na mba ahụ akaatọọla ya bụ atụmatụ n'ihi na ha kwuru na o megidere igbaso usoro ọchịchị onyekwuouche ya n'okwu mba Briten ịpụ n'otu European Union nke a ma dịka 'Brexit' n'aha ịchafụ.

Onyeisi ụlọomeiwu mba Briten bụ John Bercow, kwuru na nke a bụ "ome megide iwu"

"Etu ọbụla e siri lee ya anya, ihe mere e jiri kwụsị ụlọomeiwu ọrụ bụ iji gbalahụ ndị omeiwu itinye ọnụ n'okwu gbasara 'Brexit' nakwa ịrụ ọrụ iso hazie ogboro mba anyị na-agbaso."

Nkenke aha onyonyo Jeremy Corby sị, "ịkwụsị ụlọomeiwu ọrụ n'ike bụ ihe a gaghị anabata."

"Nke a bụ ihe ọjọọ megidere ọchịchị onyekwuouche ya nakwa ikike dịịrị ndị omeiwu."

Onye ndu pati Labour bụ Jeremy Corbyn kwuru na " ịkwụsị ụlọomeiwu ọrụ n'ike bụ ihe a gaghị anabata. Ihe Praịm Mịnịsta mere bụ tigbuo-zọgbuo nweta mkpebi 'no-deal'"

Ihe 'no-deal' pụtara n'okwu Brexit bụ na mba Briten ga-ahapụ otu European Union na-enweghị nkwekọrịta otu ha ga-esi gbaso.

Ọ pụtakwara na Briten ga-apụta ozugbo n'otu ọbụla o sonyeburu na ya dịka Ụlọikpe Ukwu nke European Union (European Court of Justice), nke nchekwa (Europol) nakwa otu ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru 12.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara