South Africa: Aka akparala ndị uweojii 4 maka ogbugbu onye Naịjirịa na South Africa - Dabiri-Erewa

Uweojii Sawụt Afịrịka ji onye nọ ebe ọgbaghara dị Image copyright AFP

Ndị uweojii anọ a na-eche n'aka ha dị n'ọnwụ Pius Abiaziem n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgọst na mba Sawụt Afịrịka nọzị n'aka ndị uweojii, dị ka Abike Dabiri-Erewa siri kwuo.

Odozi akụ Dabiri-Erewa bụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ndị Naịjirịa bi ofesi tinyere ozi na akara Twitter ya.

Nke a na-abịa ka ndị uweojii nke Sawụt Afịrịka anwụchịela mmadụ iri na asaa ndị aka ha dị na mkpamkpa kpara n'obodo Pretoria ebe ndị mmadụ zuru ohi ma gbaakwa ụlọahia ndị mbiarambia ọkụ.

Nsogbu a bidoro n'ụbọchị Wenesde mgbe otu onye a na-eche na ọ bụ onye na-ere ọgwụike gbagburu onye ọkwọ ụgbọala.

Ndị otu ndị na-akwọ ụgbọala kwuru na ọbụghị ha bidoro ngagharịiwe a na ihe ọjụọ ndị ọzọ soro ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ejirila ikpaoke agwụrụ mara Saut Afrịka

Otu onye ọkwọ ụgbọala gwara BBC na ọ bụ onye gburu onye otu ha ka ha na-achọ.

O kwukwara sị na "ndị uweojii soro na-ezu ohi mgbe ogbaaghara na-eme, onweghị ihe ha mere".

Ọ sị : "Anyị anaghị atụ ndị Naijirịa ụjọ . . . ihe a abụghị maka ikpa oke agwuru".

BBC na Onowu Ezealị Ndubueze Udeji bụ onye so na-ahazị nke ndị Igbo bị na Sawụt Afrịka dịka eze ọdịnanị nwere mkparịta ụka maka mkpamkpa a.

Onowu Ezeali kwuru na ọ bụ onye Tanzania na onye ọkwọ ụgbọala nwere nsogbu na Pretoria nke mere ka onye Tanzania gbaguo onye ọkwo ụgboala ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionElisabeth Ndubuisi Chukwu: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Sawụt Afrịka'

Nke a mere ka ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka bu ngagharịiwe gaa n'isi ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba ahụ maka oke ohi na ogbugbu a na-egbu ha na Saụt Afrịka.

Ọtụtụ n'ime ha sị na e zuchaala ngwaahịa ha niile n'ime mwakpo e mere ha na Wednezde ụbọchị iri abụọ na asatọ ọnwa Ọgọst.

NCC chọrọ iri ndị ụlọọrụ ekwentị iwu

Mịnịsta na-ahụ maka mkparịtaụka bụ Isa Ali-Pantami afanyela ndị ọrụ ya ọkụ n'ike ka ha nyocha ụlọọrụ nzikọrịta ozi n'ekwentị maka oke data ha na-amịpụ n'ekwentị ndị mmadụ

Pantami dịka ọ malitere ọrụ ya n'uju sị na e kwesiri iri ụlọọrụ ndị a iwu maka mkpesa ndị mmadụ na-enye akarịala.

N'egwuregwu

Image copyright @thenff

Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falconets a maburula ọlaedo n'egwuregwu zuru mba Afrịka ọnụ site n'iji penariti ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Kameruun.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Isiokwu Ndị Emetụtara