PRODA Enugu state ekwela nkwa ịrụpụta mkpịsị odee nde 15 kwa afọ - PRODA Enugwu

PRODA

Gọọmentị etiti Naijiria esila n'ọnụ ndị isioche na-achịkọba ụlọọrụ nka na ụzụ dị n'Enugwu bụ Projects Development Institute (PRODA), wee kwuputa na ha ebutechaala ngwaọrụ ha ga-eji malite imepụta mkpịsị odee ga-akarị nde 15 kwa afọ.

Onye isi ndị bọọdụ PRODA bụ Mazi Daniel Donald Onjeh, kwuputara nke a oge ya na ndị otu ya bịara na PRODA Enugwu ile ka e si eguzobe igwe e ji arụ ọrụ nakwa ịhụ ka ndị ọrụ mere.

Onjeh kwuru na PRODA malite ime mkpịsị 2B na HB, Naijiria ga-esonye na mba ndị na-arụpụta 'pencil' na mpaghara ndịda-anyanwụ Afrịka.

O kwuru na ọ bụ ụmụafọ Naijiria ga-arụ ha niile, mGọọana kwuo na ha nwetara enyemaka ngwaọrụ nakwa ka e si arụ ya n'aka ndị ọkachamara na mba China.

N'ihi nke a, a dọnyela akụrụngwa mmepụta mkpịsị 21 na PRODA ebe ọ na-echezi mmalite ọrụ oge na-adịghị anya.

Ndị isi oche ahụ na onye direktọ PRODA Enugwu bụ Dkt. Charles Agulanna, nakwa ndị isi ndị ọzọ tinyekwara ọnụ wee gụpụta ihe ndị ọzọ ndị PRODA na-arụpụta.

Ha kwukwara na ha nwere olileanya ịrụpụta ihe ndị dịka 'Lithium Battery', unyi anaghị ewepụta anwụrụ ọkụ, seramiks, ngwaọrụ na-esi n'akpụ emepụta garri, 'turbine' na-eji mmiri enye ụlọọrụ maọbụ ụlọ mmadụ ọkụ, ụgbọala nakwa ihe dị iche iche.

Cheta na minista na ahụ maka sayensị na teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu, kwuburu afọ anọ gara aga na ya bụ mkpịsị odee bụ nke ndị PRODA ga-ebido ịrụpụta.

Onjeh na onwe ya kwuru na ya bụ nkwa gọọmentị etiti kwere ga-abịa na mmezu oge adịghị anya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSON: Anyị na-amachị ngwa ahịa adigboroja kwa ụbọchị