Robert Mugabe anwụọla n'afọ 95

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRobert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na bụ na Robert Mugabe bu onye mbụ chịrị Zimbabwe ka ha nwetere ọchịchị onwe ha awụọla n'afọ 95.

Ọ nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa dịka ezinaụlọ ha gwara BBC .

Mugabe bụ onye ndị agha chụpụrụ n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba 2017, nke mechiri ọchịchị ọ malitere kamgbe afọ iri atọ.

Image copyright AFP

Onye odeakwụkwọ n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ya bụ Fadzayi Mahere dere na Twitter ''Laa n'udo, Robert Mugabe".

A mụrụ ya na 21 Febụwarị, afọ 1924 n'obodo a kpọrọ Rhodesia n'oge ahụ.

A tụrụ ya mkpọrọ n'ihe karịrị afọ iri na-ekpeghi ya ikpe mgbe ọ katọchara gọọmentị Rhodesia n'afọ 1964.

Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa suru kpọm n'ajụjụ ọbụla ndi mmadụ nwere maka ọnwụ Mugabe mgbe gbasara ozi maka ya n'akara Twitter ya.

Maazị Mnangagwa bụbụ osote Mugabe tupu achutuo ya n'ọkwa.

Nke a dị mkpa makana onwela ọtụtụ oge a na-ekwubu na Mugabe anwụọla, ma o mecha bụrụ asị.

Mgbe Mugabe malitere ọchịchị, ọtụtụ mmadụ n'ụwa dum na-eto ya maka etu o si haziegharịa ọnọdụ ahụike na agụmakwụkọ.

Ihe kpatara okwu bụ atụmatụ owepụtala iji nakọ ala ọ sị na ndị ọcha nara ndi be ha n'ike.

Robert Mugabe - Oge d mkpa

  • 1924: Ụbọchị amụru ya
  • Omechara ga-akwụkwọ
  • 1964: Gọọmentị mba Rhodesia tụrụ ya mkpọrọ
  • 1980: Meriri ntụlịaka ka ha nwetere ọchịchị n'aka ndi ọcha
  • 1996: Ọ nụrụ Grace Marufu
  • 2000: Ọ dara ntụlịaka onye kwuo uche ya, ndị na-akwado ya buru egbe wakpo ụgbo ndị ọcha ma wakpokwa ndị ndọrọndọrọ anọghị n'ọchị
  • 2008: Pụtara dịka onye nke abụọ emere, mana onye nke mbụ bụ Morgan Tsvangirai sepụrụ isi ka mwakpo ndị otu ya malitere
  • 2009: Ka akụnaụba mba ahụ malitere ịda, o chere Tsvangirai iyi ọrụ dịka Praim Minista, bụ ọkwa o ji ruo afọ anọ
  • 2017: Ọ chụrụ Osote Onyeisiala Emmerson Mnangagwa n'ọrụ, iji nye ohere ka nwunye ya bụ Grace ịnọchị anya ya
  • November 2017: Andị agha Zimbabwe tinyere aka ma kwanye ya iritu n'ọchịchị.

Isiokwu Ndị Emetụtara