Caster Semenya amalitela ọgbụgba bọọlụ

semenya Image copyright FABRICE COFFRINI

Onye ọgbọsọ a ma ama na mba Sawụt Afrịka bụ Caster Semenya esorola nzọmụkwụ Usian Bolt n'ịbanye n'egwuregwu bọọlụ.

Semenya denyere aha ya n'otu JVW nke ụmụnwaanyị na Saụt Afrịka ma malite iso ha eme ọmụmụ.

Cheta na otu IAAF na-elekọta ndị ọgbọsọ nyere iwu ka Semenya na-aṅụ ọgwụ ga-ebutu 'Testosterone' dị ya n'ime ahụ tupu o sonye n'asọmpị ịgba ọsọ ọbụla.

Ugwu ikpeazụ nke Mugabe

Image copyright Getty Images

Muhammadu Buhari, Goodluck Jonathan na Emeka Anyaoku esonyela ndị Naijira nwere agba n'ịkwanyere Robert Mugabe ugwu ịkpeazụ dịka ọ nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Fraide.

Mugabe chịburu mba Zimbabwe nwụrụ ka gbachara afọ iri itoolu na ise n'ụlọọgwụ na Singapore ka ọ rịachara ọrịa obere oge.

Ihe Umahi jetere n'Abuja

Image copyright facebook.com/femi.adesina

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwenyela n'okwu ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ gwara ya gbasara ihe dị icheiche metụtara mpaghara ahụ.

Ihe ndị a gụnyere ọdọụgbọelu Enugwu, mmachị ndị ọchịehi n'ọwụwaanayanwụ, ịrugharị okporo ụzọ esi abata ọwụwa anyanwụ na ndị ọzọ

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images

Otu nchọpụta otu United Nation mere na-ekwu mba Nọt Koria ejirila ụzọ azụụ1ọ were Intanetị zuo ego ha ji arụ ngwa agha ha.

Otu ọmụma atụ ha nyere bụ na e zigara ndị ji ụzọ zubante n'igwe na-enye ego Bekee kpọrọ ATM nke otu mba were dọbiri ego ugboro puku iri kesaa na mba iri abụọ na naanị elekere ise.

Gee Nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ịba 'yellow fever' abanyela na steeti abụọ

Image copyright Science Photo Library
Nkenke aha onyonyo Anwụnta na-ebute ọrịa ịba 'Yellow fever'

Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka nchekwa megide ọrịa a kpọrọ 'Nigeria Centre for Disease Control' agbaala ama na ọrịa 'Yellow fever' abatala Bauchi nakwa Borno steeti.

N'ozi mgbasaozi nke onye nnyemaka mgbasaozi ụlọọrụ ahụ bụ Jeremiah Agenyi zitere BBC Igbo, NCDC kwuru na o weela anya na ọrịa 'yellow fever' ahụ ji mmadụ anọ na Bauchi steeti.

"Atọ n'ime ndị ọrịa ahụ ji bụ na ọkpụụ ọchịchị Alkaleri, ebeonye nke anọ bụ onye njem nlegharị anya na aga Kano State nke gakwara ebe nlegharị anya 'Yankari Games Reserve' dịkwa na otu okpuru ọchịchị ahụ."

NCDC kwuru na ha nwetaburu ozi banyere mgbakabụta ọrịa 'yellow Fever' n'abali 29 nke ọnwa Ọgọstụ na Kano steeti site n'otu ụlọọrụ nnyocha ọbara dị na steeti ahụ.

Nnyocha ndị nnyocha nke Kano steeti bụ "Kano State Epidemiology Team' gara n'ihu mee gosiri na onye butere ọrịa ahụ na nna ya gara 'Yankari Game Reserve' na Bauchi n'ọnwa Ọgọst.

Mana nna ya nwụrụ tupu e nwee ike ịmịị ọbara ya maka nnyocha.

Ọzọkwa, NCDC gbara ama na n'abalị atọ nke ọnwa Septemba, afọ 2019, ndị nnyocha ọrịa Borno steeti 'Borno State Epidemiology Team' wetara ha ozi na asaatọ ụmụakwụkwọ n'ime 95 ebe a na-azụ ndị nkuzi 'Waka College of Education' dị n'okpuru ọchịchị Biu LGA na Borno steeti ndị gara otu Yankari Game Resort dara n'ọrịa , ebe mmadụ isii n'ime ha nwụrụ.

Ka ọ dị ugbua, ndị fọọ na-enweta nleta, ebe a na-enyocha ọbara ha iji ma ihe mere mmiri ji banye n'opi ụgbọgụrụ."

'Yellow Fever' bụ ụdị ịba na-agbasa ma anwụnta bụ nje na-ekesa ya taa mmadụ nke nwere ike igbu onye o ji ihe dịka abali asaa maọbụ iri o jiri nweta nje ahụ..

Njirimara onye na-arịa ya bụ ọrịa gụnyere ahụ ọkụ, isi ọwụwa,ọgbụgbọ, ike ọgwụgwụ,ịbaọchananya wdg.

A na-eji ọgwụ mgbochi agbalahụ ọrịa 'yellow fever'.

Ndị ọrụ pụrụiche Naịjrịa awụchiela na Saụt Afrịka

Image copyright Abubakar/Facebook

Ndị ọrụ pụrụiche onyeisiala Buhari zipuru mba Saụt Afrịka ezute onyeisiala ha bụ Cyril Ramaphosa eruola ebe ahụ ugbua.

Onyeisi ụlọọrụ 'National Intelligence Agency' bụ Ambasadọ Ahmed Abubakar nọchitere anya onyeisiala Buhari.

Onye na-anọchite anya Naịjirịa na Saụt Afrịka nakwa ndị ọrụ ndị ọzọ nabatara Abubakar n'ọdọụgbọelu O.R Tambo dị na Johanisbọgụ.

A na-atụ anya na ọ ga-ezute onyeisiala Ramaphosa n'ụbọchị Fraịde abalị 6, Seputemba 2019.

Umahi gara hụ Buhari

Image copyright EBONYI GOVERNMENT

Gọvanọ Umahi nke Ebonyi State ekwuola na ya agaghị eji ka ya meta otu Ipob mma ghara ịrụ ọrụ ya dịka onyendu

Umahi kwuru nke a mgbe ọ gara ihu onyeisala Buhari, sị na ọrụ ya bụ ime ka ndị Igbo bi na ụgwụ nwee udo dịka ndị ugwu bi na ndịdị.

Serena Williams abaala agba nke ikpeazu na US Open

N'egwuregwu, Ezenwaanyi Tennis bụ Serena Williams etozuola oke ịpịa agba nke ikpeazụ na asọmmpi n'US Open.

Serena meriri ogbo ya nke Ukren bụ Elina Svitolina iji chụọ mmeri Grand Slam nke iri abụọ na anọ ya.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị