Joel Kachi Benson: Nwaafọ Igbo ejirila akụkọ ụmụakwụkwọ Chibok rite nturuugo na mba ofesi

Joel Kachi Benson Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Joel Kachi Benson sị na ọ dị ya ka ọ na-arọ nrọ

Ihe nkiri Joel Kachi Benson mere maka ncheta afọ ise a tọrọla ụmụakwụkwọ Chibok enyela ya nturuugo na mba ofesi.

Ihe nkiri ahụ a kpọrọ "Daughters of Chibok" ritere "akụkọ VR kacha mma" n'ọgbọ nturuugo ndị ihe nkiri e mere n'obodo Venice dị na mba Itali.

Benson gara n'ihu kọwaa etu o si si n'ebe ikpofu ahịhịa bụrụ onye e buliri elu na onye ụwa kpụ n'ọnụ taa.

Lee mgbe a ga-eli Mugabe

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo E gburu ihe karịrị mmadụ 100 n'ọgbaaghara dara na ndọrọndọrọ ọchịchị nke wepuru Mugabe n'ọkwa mana ọ na-eme mkpesa na ndị ọcha na-achọ ịchutu ya n'ọkwa.

Ndị mba Zimbabwe ekwuola na a ga-akwa Robert Mugabe bụ aka chịburu mba ahụ n'ụbọchị 14 tupu e lie ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 2019.

N'akwụkọ ozi ha kesara nye ndị nnọchiteanya ndị mba ọzọ, ha kwuru na a ga-akwa ya dịka e si akwa onye chịburu mba ha nke Bekee kpọrọ "state funeral".

A ga-kara ya ụka e ji akwa ya n'ọgbọegwuregwu dị n'isiobodo Harare.

Omo-Agege bu ụkpa ekele bịa

Image copyright Sen Ovie/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu

Ovie Omo-Agege bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ekeleela ndị Delta sentralụ bụ ndị ọ na-anọchite anya ha nakwa ndị Naịjirịa.

O kelere ha maka ikwado ya dịka ụlọikpe e hibere maka ihe ndapụta na ntuliaka nyere ya mmeri n'oche ya ọ na-azọ.

Trump akagbuola nzukọ ya na Afganịstan

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akagbuola nzukọ nzuzo ya na onyeisi mba Afghanistan na ndị Taliban kwesịrị inwe gbasara ịkpa etu agha dị n'etiti mba abụọ ahụ kemgbe afọ iri na asatọ ga-esi ebi.

Ọ kagburu nzukọ ahụ makana ndị Taliban kwetere na aka ha dị na mwakpo gburu otu onye agha Amerịka nso nso a.

Otu bọolụ nkata Naịjirịa ga-aga Olimpiks 2020!

Ndị otu bọọlụ nkata Naịjirịa awụferela ebe ha ga-eso zọọ asọmpi Olimpiks nke a ga-eme na Tokyo n'afọ 2020.

Naịjirịa meriri Chaịna na mba ha taa, nke mere ka ha zọta naanị otu oche na-eru Afrịka n'asọmpi a.

'Anyi adịla njikere ka anyi na Ipob nwee nzukọ' - Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Image copyright TWITTER/@GOVDAVIDUMAH

Ndi gọvanọ ọwụwa anyanwu ekwuola na ha enweghị ikike imachị ndi Ipob kama na ọ bụ emume ha ka ha machiri.

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru sị na ndị Govanọ ọwụwa anyanwu adịla njikere ka ha na ndị Ipob nwee nzụkọ ka ụdo were chịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Umahi kwuru nkea n'ụbochị Tọzde ma si ka ndị Ipob hibe ụbọchi na ebe ọbụla ha chọrọ ka ha na ndị Gọvanọ nwee nzuko na ndị Gọvanọ ga-abia.

Ọ kwukwara na ha na ndị Ipob bụ umunne na ihe kacha mma ugbua bụ ka ha na Ipob nwee nzụkọ.

Nke a na-abịa dịka ndị Ipob degara ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu akwụkwọ n'ụbochi Wenezde ebe ha kwuru ihe ha chọrọ ka gọọmenti mee nke gụnyere iwepụ mmachi amachiri Ipob, ma kwe ka emume gbasara Biafra na-aga n'ihu n'ọwụwa anyanwu niile.

Ngagharị nd Shia ga-eme n'ụbọchi Tuzde

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo ' Anyị anaghị agwado ọgụ, anyị ji ụdọ eme ngagharị anyị ' IMN

Otu gọọmenti Naijiria machiri amachi bụ Islamic Movement of Nigeria (IMN) eji Shia mara, amaala ndị uweojii aka n'ihu ma kwuo na ha ga-eme ngagharị ncheta ọnwụ Husayn Ibn Ali n'ụbọchi Tuzde na agbanyeghi mmachi amachiri ha kama ya rie isi ha.

Ọnụ na ekwuchitere ndị Shia bụ Ibrahim Musa kwuru na ndị Shia ụwa niile na-eme ngagharị a, na nke ha agaghị apụ iche.

Musa kwuru na ngagharị ha agaghị enwe ọgba aghara ọbụla n'ihi na ụmụ ha na nwunye ha ga-eso.

N'aka nke ọzọ , ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba zahachiri ha ma kwuo na ha nwaa ya ka ha hụ ihe oku ji ntị oke eme.

Xenophobia: 'Onweghị ihe ga-eme ụloọrụ ndị Saụt Afrịka d na Legos' - Sanwo-Olu

Image copyright OTHER
Nkenke aha onyonyo 'Anyi na ndị uweojii ga-akpa ihe a ga-eme ndị soro mee mwakpo ụloorụ ndi Saụt Afrịka

Gọvanọ Legos Steeti bụ Babajide Sanwo-ọlụ akatọọla mwakpo awakporo ụlọọrụ ụfọdụ ndị mba Saụt Afrịka dị na Legọs.

O kwuru na ọ nyere iwu ka ndị nchekwa niile na Legos mee ihe niile ihu na enwere nchekwa ụloorụ ndi Saụt Afrịka niile dị na Legos.

Akụkọ anyị na Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla.

N'Ofesi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihe dịka ndị agha ruru 14,000 nke mba Amerịka nọ n'Afghanistan

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ kagbuola atụmatụ ikpe udo Amerịka na ndị otu Taliban nwere na Afghanistan dịka ndị otu ahu kwuru na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe gburu otu onyeagha Amerịka n'ụbọchị Tuzde.

Trump Kagbukwara nzụkọ ya na ndị isi Taliban na ọnyeisiala Afghanistan bụ Ashraf Ghani kwesiri inwe n'ụbọchi Sọnde.

N'Egwuregwu

Image copyright Getty Images

Iko 'Grand Slam' nke 'US open 2019' abụrụla Serena Williams ọ nọ nso eru aka dịka Bianca Andreescu nke Kanada gbara afọ 19 meriri ya n'agba nke ikpeazụ nke asọmpi a.

Dika ọ dị ugbua, nke a bụ ụgboro ano a na-emeri Williams n'agba nke ikpeazụ n'iko 'Lawn Tennis.'

Lee akụkọ ga-amasi gị

Lee ihe nkiri ga-amasi gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo Language: Lee aha Igbo ndị mmadụ kpọrọ 'Graduate'