South Africa Xenophobia: "Ihe e mere anyị bụ ihe nyere anyị mbọ mbọ ọsọ na South Africa"- Nwaanyi Igbo si SA alọta

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSouth Afrịka Killings: "M na di m na ụmụ atọ anyị na-agbalaga"

Nwaanyi na-achọghị ka edepụta aha ya ekwuola ihe mere o ji kpọkọrọ ezinụlọ ya, si mba Saụt Afrịka na-agbalata Naịjirịa.

Nwaanyị ahụ kwuru na ọ bụ oke mkpagbu ndị Saụt Afrịka na-emeso ndị mbịarambịara na-eme ka ndị mmadụ gbapụ n'obodo ha.

O kwuru na ọ kara ya mma na ya na ụmụ atọ ya gbalagara zọta ndụ ha karịa ma ikwe ka ndị Saụt Afrịka were iwe na ọnụma meruo ha.

Etu ihe si kwụrụ ugbua na nhazi a na-eme maka ndị Naịjirịa chọrọ i si Saụt Afrịka lọta

Onye nnọchiteanya Naịjirịa na Johannesburg bụ Godwin Adama kwuru na ihe karịrị mmadụ narị isii edenyela aha isonye ụgbọlelu e ji bụla ndị chọrọ i si Saut Afrịka laghachị Naịjirịa.

O kwuru na ụgbọelu Peace abụọ ga-amalite ịbụlaga ndị a n'ụbọchị Wenezde.

Adama kwuru na ya na ndị otu ya na-agba mbọ ị hụ na ndị Naịjirịa chọrọ ịlaghachite denyechara aha n'akwụkwọ.

O kwuru na ndị nọ na nga agaghị esonye na ya bụ atụmaatụ makana ebe ha nọ enweghị nsogbu mana ụfọdụ ndị n'ụlọ ndị a chọrọ ịgbara ụgbọ nwa mkpị ga-esonye.

Adama kwuru na ha na-edekọ aha ndị niile e mebiri ụlọ ahịa ha ka ha wee mara etu ọzọ ha ga-esi mee ihe gbasara ndị a.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a