Gernot Rorh: Nne onye nkuzi ndị "Super Eagles" alaala mmụọ.

Gernot Rohr na nne ya, Elizabeth Image copyright Twitter/@thenff
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr na nne ya, Elizabeth

Arịrị juputara n'obi Gernot Rohr bụ onye na-akụziri ndị otu egwu bọọlụ "Super Eagles" nke Naịjirịa.

Nke a bụ maka ọnwụ nne ya bụ Elizabeth Rohr onye gbara afọ iri itoolu na asaa tupu ọ laa mmụọ.

Ndị nchịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjiria bụ "Nigeria Football Federation" tiri Rohr aka n'obi n'akara Twitter ha.

N'aka nke ọzọ, otu NFF ekwuola na ha anabatala Salisu Yusuf ma tinyeghachi ya dịka onye isi nkuzi bọọlụ ndị "Super Eagles".

Yusuf laburu ntaramahụhụ otu afọ maka ịna aka azụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego

Ụlọọrụ BBC gbara Yusuf n'anwụ n'ihi ịna aka azụ otu puku dọla iji họrọ ndị ọgba bọọlụ ụfọdụ ka ha soro na asọmpi "African Nations Championship" na 2017.

Ndị gbara ọsọ ndụ na Saụt Afrịka

Ụmụ Naịjiria si Saụt Afrịka gbalata, na-ekwu ọ bụ kamgbe Nelson Mandela nwụchara ka ndị mba ahụ ji malite imekpa ha ahụ.

Ejike Okoro bụ otu n'ime ndị so ụgbọelu Air Peace wee gbalata kwuru nke a oge ya na BBC nwere mkparịta ụka.

Okoro, onye na-arụ ọrụ aka sị na ọnọọla na Saụt Afrịka ihe ruru afọ itoolu.

Ya na ndị ọzọ so were lọta buuru ụkpa ekele bunye Allen Onyema onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace nakwa gọọmentị etiti maka ịbịa zọpụta ha.

Mmadụ 22,000 na-efu efu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka bi n'ebe ndị gbara ọsọ ndụ na-ebi na Adamawa Steeti

Ihe ruru mmadụ puku iri abụọ na abụọ ka a na-achọ achọ n'ihi mkpamkpa ndị otu Boko Haram na-akpa na mpaghara ugwu Naijiria.

Dịka ndị otu Red Cross si kwuo, imirikiti n'ime ndị a na-efu efu bụ ụmụaka nke pụtara na ọtụtụ ndị nne na nna amaghị ma ụmụ ha a dị ndụ ka ha anwụrụ anwụ.

Peter Maurer, onye isi ndị Red Cross n'ụwa niile kwuru na nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ha dekọwara aha ndị na-efu efu na mba dị iche iche n'ụwa a.

O kwukwara na ndị otu ya achọtala mmadụ ruru 367 ma kpọghachi ha n'ezinụlọ ha.

Olili Mugabe

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Gọọmentị Zimbabwe ebe ha na-akwanyere Mugabe ugwu dịka aka chịbụrụ ala ahụ

Onye nwụọ ọ ga zuru ike, mana Robert Mugabe, aka chịburu mba Zimbabwe, ezubeghị ike dịka ezinaụlọ ya na gọọmentị mba ahụ na-azọ ebe a ga-eli ya.

Ezinaụlọ Mugabe na-eti mkpu na ọ bụ na ebe e liri nna nna ha ka a ga eli ya, mana gọọmentị na-ekwu na a ga-eli Mugabe ebe a na-eli ndị dike obodo ji biri.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRobert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ

Ndị be Mugabe gbarụrụ ihu na gọọmentị ajụghị ha ese mgbe a na-akpa maka olili nna ha.

Ka ọ dị ugbua, e kpebiela na a ga-eli Mugabe n'obodo ya.

Ngagharịiwe maka ụkọchukwu egburu

Ndị uka na Kaduna steeti emeela ngagharị iwe gbasara onye ụkọchukwu ha ndị omekome gburu na okpuruọchịchị Jema dị n'ọdịda anyanwụ steeti ahụ.

Egburu Alhamdu Mangadus n'ụgbọ ya ụnyahụ, dịka onyeisi ndị otu Christain Association of Nigeria bụ Joseph Hayab si kwuo.

Maka ọsọ ndụ na Saụt Afrịka

Mmadụ dị otu narị na iri asatọ na asaa nke Airpeace butere bụ ndị gbara ọsọ ndụ gbara ụkwụ na Murtala Mohammed Airport n'abali Wenzde.

Onye na ahụ maka mmekọrịta Naijirịa na mba ọzọ bụ Abike Dabiri sị na ọ bụ ihe ihere na ndị isi ojiri ka na egburita onwe ha ma na agbanyeghị, na Naịjirịa ga na-ekpe udo.

Boko Haram awakpola obi ndị agha

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria

Ndi agha nọ Borno steeti agbala ama na ndị omekome Boko Haram wakporo obi ha dị na Gudumbali gburu mmadụ itoolu, ebe Mmadụ iri abụọ na isi ndị ọzọ na-efu efu

Ọnụ na-ekwuru ndi agha bụ Sagir Musa kwenyere na mwamkpo a mere mere ụbọchị Tuesday mana ya amaghị maka ndị egburu.

France emeela Amerika ntọọ na Basket bọọlụ

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo France erubeghi isingwucha egwuregwu a mbụ mana ha gbatala ndị nke atọ na 2014

N'egwuregwu, France anarala Amerika ụra rahụ na-egwu ha ma agba bụ basket bọọlụ na asọmpi iko mbaụwa Basket bọọlụ a turu na China ụbọchi Wenezde.

France banyegoro agba nke anọ ji ọkpụ iri asatọ na itoolu (89)merie ndị Amerika bụ ndị tụtara nkata iri asaa na itoolu (79).

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla.

Akụkọ ga-amasị gị