Election Tribunal: Ọkpụrụkpụ okwu ise ụloikpe ntuliaka ji nye Buhari mmere

Muhammadu Buhari Image copyright Getty Images

Ọ ka na-agbagwoju ụfọdụ anya ihe mere ụlọikpe pụrụ iche jiri nye onyeisiala Muhammadu Buhari mmeri ka ọ nọsie ike dịka onyeisiala Naiịjrịa.

Ụlọikpe ahụ nke Mohammed Garba nọ n'isi ya kwuru na PDP na Atiku achikọtaghị okwu ha na ndị akaebe ha kpọtara ọnụ.

PDP kpọrọ ndị akaebe 62 maka ya bụ ikpe.

Ihe a bụ okwu ise gbara ọkpụrụkpụ ha jiri welie ya aka elu n'Abuja ụnyahụ bụ Wenezde:

  • Buhari nwere asambodo ụlọakwụkwọ ndị agha nke London nyere ya karịri nke secọndrị. Nke a mere ka o tozuo ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.
  • O kwuru na Buhari asịghịri ndị Inec asị ka e were tinye aha ya na ndị ga-azọ ya bụ ọkwa n'afọ 2019.
  • Ọ bụrụgodi eziokwu na Osote onyeisiala, Yemi Osinbajo ji ego Tradermoni chụọ nta vootu, agaghị ewe ya maka na aha Osinbajo esoghị na onye agbara akwụkwọ n'ụlọikpe.
  • Agaghị etinye ọnụ n'okwu na ndị agha mere mpụ na oge nuliaka ahụ maka ha esoghị na ndị agbara akwụkwọ.
  • Ụlọikpe ahụ kwukwara na PDP na Atiku e nwere ike ịkọwatara ya na Ince ji igwe "card reader" zipu mpụtara nuliaka ahụ.

N'ihi nke ka ụlọikpe ji wezụga ya bụ ikpe dịka okwu enweghị isi.

Ndị so kpee ya bụ ikpe bụ Jọstis Abdul Aboki, Joseph Ikyegh, Samuel Oseji, nakwa Peter Ige.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a