Etu ọnwụ di maọbụ nwunye nwere ike isi butere onye nke dị ndụ oke agụụ

Nwanyị di ya nwụrụ anwụ Image copyright Getty Images

Di mmadụ ịnwụ bụ ihe oke mgbawa obi, mana otụtụ omenala na mba dị icheiche n'ụwa na-eme ka ahụhụ ụmụnwaanyị di ha nwụrụ kawanye njọ - tụmadị ma a bịa n'ihe oriri.

Onye ntaakụkọ BBC bụ Emily Thomas kọwara na ụfọdụ omenala anaghị ekwe ụmụnwaanyị di ha nwụrụ anwụ rie nri mgbe ha chọrọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWidowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ

Ụfọdụ na-egbochi ha iri nri ndị na-edozi ahụ, ebe ndị ọzọ na-enye ha ihe nwere ike imekpa ahụike ha ahụ ka ha rie.

Iji maa atụ, na mba Gana, e nwere omenala na-amanye nwaanyị di ya nwụrụ ka o rie ofe e ji akụkụ ahụ di ya nwụrụ anwụ sie.

Ihe dị ka ntutu isi maọbụ mbọaka onye nwụrụ anwụ ka a na-ewere tinye n'ofe bịa manye nwunye onye ahụ ka o rie ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mgbe ụfọdụ a na-ewere mmiri e ji saa onye nwụrụ anwụ ahụ bunye nwunye onye ahụ ka ọ ṅụọ

Fati Abdulai, onyeisi otu a kpọrọ "Widows and Orphans Movement" nke dị na Gana kwuru na mgbe ụfọdụ, "a na-asa onye nwụrụ anwụ ahụ, bịa were mmiri ahụ gwakọọ n'ihe ndị ọzọ, nye nwunye onye ahụ ka ọ ṅụọ".

Ọ na-abụkarị ụmụnwaanyị dara ogbenye ka a na-eme ụdị ihe a. Ndị bara ọgaranya anaghị anata ụdị mmegbu a.

N'omenala ụfọdụ, nwaanyị di ya nwụrụ anaghị eketa akụnụba ya ma ọ bụrụ na ọ lụghị otu n'ime nwanne di ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

Nke a pụtara na ọtụtụ ụmụnwanyị isimkpe na-adakarị ogbenye.

A na-eche na ihe ruru ụmụnwanyị nde 285 bụ ndị isimkpe n'ụwa niile.

A na-echekwa na otu n'ime ụmụnwanyị iri ndị isimkpe bụ ndị dara oke ụbịam.

"Ndị isimkpe anaghị eri azụ, anụ maọbụ akwa"

Image copyright Chitrita Banger Gee
Nkenke aha onyonyo Nne Chitrita Banger Gee bụ Anita Banerjee na nne nne ya bụ Prabhabati Mukerjee

Na mba ụfọdụ n'ụwa, mmekpa ahụ ụmụnwanyị isimkpe ka na-aga n'ihu ruo taa.

Na mba India, ụmụnwaanyị ndị di ha nwuru anaghị eri azụ, anụ, akwa, yabaasị nakwa "garlic".

Chitrita Banger Gee, onye ọkacha mara na nri na-edozi ahụ n'obodo Bengali, India, kwuru na ihe dị otu a jọgburu onwe ya.

"Ọ dịzi ka a ga-asị na ọ bụ nwaanyị ji aka ya kpatara onwe ya ọnwụ di ya, nke mere e ji ata ya ahụhụ".

Gee kwuru na mgbe papa nnukwu ya nwụrụ, mama nnukwu ya husiri anya.

"Ọ gbanwere n'otu ntabi anya. Ọ kwụsịrị iyi akwa mara mma, yibezịe naanị akwa ọcha."

"Ọ kwụsịrị iso mmadụ niile erikọ nri maka na ọ bụghịzi ihe niile ka o nwere ike iri."

"Mana n'ihi na ọ ma ka e si esi nri nke ọma, ọ na-eji ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ anọchi anya ihe ndị ahụ a machiri ya iri."

Ihe nchọpụta gosiri

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwanyị na-elepu anya na windo

Nchọpụta e mere na mba Chaịna, Yurop nakwa Amerịka gosiri na ndị di ha nwụrụ anaghị eri ezigbo nri na-edozi ahụ.

Elisabeth Vesnaver, onye nchọpụta gbasara nri na-edozi ahụ, mere nchọpụta miri emi gbasara nri ụmụnwaanyị di ha nwụrụ na mba Canada, tụmadị ndị gbara afọ iri asa maọbụ karịa.

Vesnaver kwuru sị: "E nwere m mama nnukwu abụọ n'akụkụ nke nne m nakwa nke nna m."

"Otu n'ime ha nwụrụ ka ọ mechara afọ abụọ di ya ji nwụo."

"Ihe gburu ya bụ anaghị eri nri nke ọma n'ihi na mgbe di ya na-arịa ọrịa, ọ naghị eri nri nke ọma."

Gịnị jikọrị ọnwụ di maọbụ nwunye na nri?

Dika nnyocha Vesnaver si gosi, ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ, nwere ike ịnwụ n'ime afọ abụọ ma ọ bụrụ na a kpachapụghị anya.

Vesnaver kwenyere na ọ bụ anaghị eri ezigbo nri na-akpata nke a.

O kwuru sị: "Nnyocha gwara anyị n'ezie na a na-enwe mgbanwe n'otu ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ si eri nri."

"Ha anaghị erizi nri nke ọma. Ha na-ata ahụ. Enweghịkwa ihe na-atọ ha ụtọ."

Image copyright Jonathan Freedland
Nkenke aha onyonyo Michael Freedland with his wife Sara on their wedding day and on their 50th anniversary

Onye ntaakụkọ aha ya bụ Michael Freedland na nwunye ya bụ Sara biri afọ 52.

Mgbe nwunye ya nwụrụ n'afọ isii gara aga, iri nri bidoro hịawa ya ahụ.

N'okwu ya, "Iri nri n'ụlọ anaghịkwa enye m aṅụrị ma ncha. Naanị obere nri ka m na-eri"

"Mana e mechara m mụta ka e si eghe akwa nke ọma."

Freedland malitere tawa ahụ. Ihe niile o mere iji buo ibu amịtaghị mkpụrụ.

E mechaa, ụmụ ya manyere ya ka ọ mụọ etu e si esi nri mgbe ọ gbarala afọ iri asatọ.

"Nke a bụ ihe pụrụ iche na ndụ m, ọ gbanwere ndụ m nke ukwuu."

Ya bụ, ị chọọ ihe ị ga-emere onye di ya maọbụ nwunye ya nwụrụ, i siere onye dị otu ahụ nri, maọbụ ịkpọ ya ka o soro gị rie nri bụ nnukwu ihe ọma.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ