Igbo People: Ihe 10 mere ndị Igbo ji akpa ike n'akụkụ ụwa ọbụla ha nọ

Ndị Igbo Image copyright Lilian Fidelis/BBC/Chigozie Oguine
Nkenke aha onyonyo Igbo nwere Ebu nwe Nfụ

Che che che che Igbo Kwenu!!!!! Yaaaaa.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo na-ekwu ọtụtụ mgbe n'obodo ọbụla ị gara ma ị na-ahụghị onye Igbo, mara na ya bụ ebe adịghị mma obibi.

N'agbanyeghị na ndị Igbo bụ ndị pekarịcharịsiri mpe n'agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa, ha nọcha n'akụkụ mba ụwa niile.

Mana ọ ga-adị mma ka anyị leba anya mara ihe na-aka ndị Igbo obi n'ebe nille ụwa soturu.

1.Okwukwe n'ime ụmụ ha

Image copyright Getty Images

Chigozie Oguine bụ onye ji ego achụ ego na mba Amerịka kamgbe afọ iri abụọ kwuru na okwukwe ndị Igbo nwere n'ebe ụmụ ha nọ so ebunye ha iru ọma ebe ọbụla ha nwetere onwe ha.

O kwuru na onye Igbo ọbụla mụrụ nwa na-enwe okwukwe siri ike na nwa ahụ ga-emeriri ọfụma ebe ọbụla ọ gara, ya mere mmụọ ọma ji eso ndị Igbo.

2. Igba mbọ

I chetara mgbe anyị wetara ụnụ akụkọ onye Igbo na-azụ ahịa mgbuka na Johanesburg.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionJohanesburg: "A chụrụm n'ọrụ mana a bụzịm onye na-enye ọrụ na South Africa"

Ezenwa Ozoigbo dị afọ 30, na-ekwu na mgbe ọ bịara na mba South Afrịka, na echiche na onweghị onye ga-enyere ya aka na mba ahụ mere ya ka ọ gbasie mbọ ike.

Mbọ ọ gbara bụ na ọ na-arụ ọrụ ma na-edowe ego ọ tụkọtara na kom kom rue mgbe o zuru ịmepe ụlọahịa nke ya.

N'ọnụ ya, "Onye Igbo na-eche maka echi makana ọ chọghị ịbụ ohu kwa mgbe mgbe."

3. Ha achọghị ịkụda obi nne na nna ha zipuru ha

Image copyright Nneamaka Etoniru
Nkenke aha onyonyo Nneamaka bụ onye Ezinifite dị n'Anambra steeti bi mba Amerịka

Onye Igbo ọbụla nwere ezinụlọ o si wee pụta. Ebe ọbụla o mechara nwete onwe ya, ọ gaghị achọ ka ọkụda obi ndị bee ya tụmadị nne na nna ya zipuru ya.

Nke a mere ka Nneamaka Fidelis, onye bụrụla nọsụ na mba Amerịka gwa BBC Igbo na ọ ga-agbagide mbọ bụrụkwuo Dọkinta ahụike na mba ahụ.

4.Nwanne gosi m 'way'

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionApprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka

Ọ bụrụ na ị bụ nwafọ Igbo ma ihe a na-akọ, ị ga-anụtụgo okwu 'nwanne gosi m way'.

Ndị Igbo na-enwe anụrị pụrụiche ma ha hụ nwanne ha na mba ọzọ nke a na-emekwa ka ha nyere onwe ha aka.

Ọ bụ agwa hụ bụ ihe bidoro usoro ịgba boy n'ala Igbo nke na-euzi ewu n'ụwa niile.

5.Ha anaghị atụ egwu ilu nwaanyị maọbụ dị na mba ọzọ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya

Onye Igbo ruo mba ọzọ, ọ dabara ya na nwaokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla, ha lụwa onwe ha.

Ọ ga-amụta ụmụ na mba ahụ na bawanyezi.

6.'I na-enye m nri?'

Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Igbo bi na South Afrika na-agbasi mbọ ike

Ọ rara ahụ ị hụ onye Igbo na-arịọ arịrịọ makana ọdịghị ume ngwu. Kama onye Igbo ga-arịọ gị nrị ikparịa ya, o je kpo nsị ma nara ego ya.

Onye Igbo ga-achọ kiri kiri ọrụ na-arụchara wee na-eche ihe o na-eche ma nwekwa okwukwe na nkiru ka mma.

7. Iwulite akụ na ba obodo ha bi na ya

Image copyright @kelechiafc

Ndị Igbo anaghị agba "last". Ha ga-achọrịrị imezi obodo ha bi n'ime ya ma soro wulite akụ na ụba obodo ahụ.

Ya kpatara ebe ọ bụla onye Igbo gara ọ ga-edozi ụzọ maọbụrụ na ụzọ adịghị ma rụkwa ụlọ karaaka n'agbanyeghị na ọ bụghị be ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionErnest Ezeajughi: Etum si bụrụ Mayor na London.

Agwa a na-eme ka ndị ha bi n'obodo ha nye ha ohere ịbanye ọchịchị obodo ahụ.

8.Ha na-amụkarị asusụ na omenala obodo ndị ha bi ya

Onye Igbo ga China, ọ ga-agba mbọ mụta asụsụ na omenaala ndị ọ nọ na be ha, ka ihe na-adabara ha nkeọma.

9. Ị ma aka ziri ezi

Ebe ọ bụla ndị Igbo nọ, ha na-chọ ka ha ṅomie ihe di mma ndị obodo ahụ na-eme nwalee ma ha ga-emeli ya bụ ọkaibe.

Ụfọdụ oge, ka atụmaatụ a na-eweta anya ụfụ mana onye ma ihe ọ na-eme achọghịkwa ịma.

10. Ọnatarachi

Ọtụtụ ndị nọ na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ọnatarachị na ndị Igbo ga-atọli ute dịnara ebe ọbụla ha nwetere onwe ha n'ụwa ma sịkwa n'ọnọdụ ahụ mepụta ihe dịmma ga-abara ha uru.

Dọkịnta Chigozie Oguine na-ekwu na ihe nwereike ikpata nkea bụ na ụmụ Igbo nwere okwukwe na Chukwu nwe ụwa niile.

Akụkọ ga-akpalite mmụọ gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe chere ndi si South Africa lọta

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a