Imo Bride Price: Ihe ọ na-ewe iji lụ nwaanyị na Mbaise

Nwaanyị na-agba nkwụ Image copyright Mazi Nwonwu
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ na-ekwu na ego e ji alụ nwanyị na Mbaise buru nnukwu ibu.

Mbaise bụ okpuruọchịchị a ma ama n'Imo steeti n'ala Igbo.

Mana ugbua, ọ bụ ihe ọzọ mere ka ha bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ ma na-ewu ewu.

O si n'ihe onyonyo otu nwa amadi wepụtara na soshal midia na-akatọ ndị Mbaise na omenala alụmdinanwunye ha.

Nwa amadi a kpọrọ onwe ya Aloy kọwara etu nwanne ya nwoke si gbahapụ imeego n'isi nwunye ya maka oke ego ndị ọgọ na-ana ya.

Nke a mere ka BBC Igbo kpọtụrụ ndị ma ihe na-aga na Mbaise ka ha kọwaa ihe ọ ga-ewe ịlụ nwaanyị Mbaise.

Benedicta Nwokocha Akuezi gwara BBC Igbo n'ekwentị kwuru na 'list' eji alụ nwaanyị dị icheiche dịka omenala ndị sị dịkwa icheiche.

N'ọnụ ya "o nweghi iwu e debere na-ekwu ego ole e kwesiri iji lụọ nwaanyị na Mbaise"

Image copyright Teyanna/Instagram

Nwokocha mara atụ sị na ụfọdụ ụmụnna nwere ịkpa aka n'ihe e dere na 'list' ma ọ bụrụ na ha hụ na ọgọ ha ji ezigbo ego.

O kwukwara na ezinaụlọ dị icheiche na-eme ihe sọrọ ha ma ọ bụrụ na ọgọ ha nwoke ji ego dịka ị nara ego "ịkpughe ihu nwaanyị"

"Nke ahụ esoghi na omenala ndị Mbaise, ọ bụ ịbara nọ n'egwuregwu dị na alụmdi na nwunye ka ihe ahụ bụ"

Usoro e ji alụ nwaanyị Mbaise

Image copyright Getty Images
  • - Nara ndị ọgọ gị akwụkwọ e dere ihe ndị ị ga-azụta na ya nke Bekee kpọrọ 'list'
  • - Inye ego nchedo ụzọ

Nke a bụ ego ndị ọgọ ga-eji kwadoo maka ọbịbịa ndị ọgọ. Ọ kọwara na ụfọdụ ezinụlọ na-etinyekwu ego na ego ma ọ bụrụ na nke ọgọ ha wetara agaghị ezu.

  • - A na-ezi ndị amaala ozi na ndị ọgọ na-abịa

Ọ bụ onyeisi ndị amaala ga-agụpụta ihe ndị dị na 'list' mara ma o zuru ezu.

O nwere ụfọdụ ihe dị mkpa ekwesighi ifu efu n'ime List ahụ

  • - Oriri na nkwari

Mgbe ndị ọgọ abụọ kwetara n'ihe niile dị na 'list', ihe ọzọ bụzị ịnwebe aṅụrị

Ya bụ ma oriri ma ọṅụṅụ ma ịgba egwu na ihe ndị ọzọ sọ ọlụlụ nwaanyị.

  • - Nkwada mmanya na mpali ebele bụ ihe ndị ọzọ eji adata obere ego n'ịgbankwụ ọbụla.

Ihe aghaghị ịhụ na "list" n'obodo Mbaise

Image copyright Eze Nka
Nkenke aha onyonyo Ezenka Udochukwu Agbarakwe

- Mmanya ngwọ/mmanya nkwụ .

- Ọjị Igbo na ose ọjị.

- Mmanya 'Beer'.

-Mmanya ọkụ (schnapp)

- Anwụrụ, isi anwụrụ, nnu anwụrụ.

- Ji (nwereike iru otu narị maọbụ iri ise).

- Mmanya ọkụ.

- Anwụrụ Bekee.

-Ego ive efere - nke a na-emere ụmụnwanyị.

- Isi ego.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPalm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma

'N100,000 agaghị azụta ihe niile dị na 'list'

Image copyright @joziqueen

Nwokocha kọwara na ụfọdụ ụmụnwoke na-atụnye nwaanyị ime iji gbalahụ 'list' dị oke ọnụ.

"Nke ahụ bụ 'Short Method' ka a na-kpọ ya mgbe anyị nọ n'agbọghọ" mana n'uche ya otu narị puku naịra (N100,000) agaghị ezu iji gokọta ihe e ji alụ nwaanyị na Mbaise.

Dịka o si kọwaa, ego anaghị efu na ime ego isi nwanyị, kama ọ bụ site n'ihe e dere na 'list' ka e si emefu ego.

"Onye chọọ ime akụ nwanyị n'ọnwa Disemba, mmanya na ihe ndị ọzọ ga-aka dị oke ọnụ karịa n'ọnwa Mee"

Mana na ngwụcha, Nwokocha kwuru na ihe dị mkpa bụ ihe onye chọrọ ịlụ nwunye na ndị ọgọ ya kwekọrịtara.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile

Isiokwu Ndị Emetụtara